Ụka Nne: Ọrụ nne na-arụ n'ezinaụlọ ehika

Chinwendu Uzoatu dere akuko a ỤKA nne, emume ome n'afọ e mere nsonso a ka bụkwa okwu a kpụ n'ọnụ ugbu a. Ka ndị ụka Anglịkan mechara, ndị ụka Katọlik mere nke ha ụbọchị ụka gara aga. Emume ụka nne bụ ụbọchị ndị nne ji emere ụmụ ha oriri bịambịam n'ọnụ. Oriri na ọṅụṅụ na-abụ onye richaa, o righarịa. Ndị bụ ụmụ tolite, ha na-ejikwa ohere ahụ lete nne ha, site n'inye ya onyinye dị iche iche iji kele ya maka ọrụ ọma ya niile. Ka a na-ekwu maka ụka nne, ka a na-ajụ sị: "Olee ọrụ dịịrị ndị nne n'ezinaụlọ?" Ọtụtụ ndị mmadụ tinyere ọnụ n'okwu, kọwaa ndị nne dịka ndị na-aghọ nkọ ka agụba n'ọrụ ezinaụlọ. Maazị Ike: Ndị nne bụ egwu e ji n'ezinaụlọ. Ọ bụ eziokwu na ha bụ osota ide ji ụlọ n'hi na ndị nna werechaa, ha ewere; ma e wepụ ha, nsogbu ga-adị maka na o nweghị onye ga-arụ ọrụ ha na-arụ n'ezinaụlọ. Ọ bụ nne na-ahụ na ezinaụlọ na-emekọta ihe ọnụ. Ọ bụ ya na-ahụ na onye ọbụla riri nri oge o kwesịrị. Ọ bụghị sọọsọ ụmụaka