Posts

Showing posts with the label Ụka Anglikan

N’Awka, Anglikan echela ụmụnwaanyị n'ihu Chineke, doo ha nsọ

O KWÒRÒ ekwò ma hịọ ahịọ n’ụlọụka ‘Chapel of Redemption’ dị n’ime Mahadum Nnamdị Azikiwe dị n’Awka, bụ isi obodo steeti Anambra, dịka ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Awka mèrè mmemme idogharị ụmụnwaanyị dayọsiisi ahụ nsọ na ichenwò ha n’ihu Chineke ọzọ, ya na ịtụ mmamma.   N’okwuchukwu ya n’òfùfè nrò ahụ, Achịbishọọpụ nke mpaghara Niger, ma bụrụkwa Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Awka, bụ ‘Most Reverend’ Alexander Ibezim kpọkùrù ụmụnwaanyị ka ha gbàá ndụ ịbụ ndị na-ekpere Chineke n’ime mmụọ nà eziokwu, ya na ịbụ ndị ga na-ahụta ma na-ewètakwa ihe ọma n’ebe ọbụla ha hụtàrà onwe ha.   O mèrè ka a mara na Chineke nyèrè nwaanyị ọbụla bụ onye ezi omume anya nke ime mmụọ iji na-ahụ ihe na-eme n’ezinaụlọ ya, n’ụlọụka, n’obodo ya, nakwa gburugburu ya n’izugbe, ya na akọnuche iji chepụta ụzọ kachasị mma a ga-esi sò ihe ndị ahụ.   Ọ kpọkùzịrị ha ka ha dị ike n’ekpere, na-asọpụrụ ọgbụgba ndụ ha na Chineke, ya na ọgbụgba ndụ alumdi na nwunye ha, ma na-egosipụtakwa akparamaagwa niile e jiri mara ezi

N’Awka, ndị Anglikan echenwòóla ndị nne n'ihu Chineke, doo ha nsọ

O KWÒRÒ ekwò ma hịọ ahịọ n’ụlọụka ‘Chapel of Redemption’ nkemahadum Nnamdị Azikiwe dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, dịka ụka Angịlịkanna Dayọsiisi Awka kàrà ụkà idogharị ụmụnwaanyị dayọsiisi ahụ nsọ na ichenwò han’ihu Chineke ọzọ, nakwa ịtụ mmamma.   N’okwuchukwu yan’òfùfè nrò ahụ, Achịbishọọpụ nke mpaghara Niger, ma bụrụkwa Bishọọpụ ụka Angịlịkanna dayọsiisi Awka, bụ ‘Most Reverend’ Alexander Ibezim kpọkùrù ụmụnwaanyị ka hagbàá ndụ ịbụ ndị na-ekpere Chineke n’ime mmụọ na n’eziokwu, ya na ịbụ ndị gana-ahụta ma na-ewètakwa ihe ọma n’ebe ọbụla ha hụtàrà onwe ha.   O mèrè ka a mara naChineke nyèrè nwaanyị ọbụla bụ onye ezi omume anya nke ime mmụọ iji na-ahụ ihena-eme n’ezinaụlọ ya, n’ụlọụka, n’obodo ya, nakwa gburugburu ya n’izugbe, ya naakọnuche iji chepụta ụzọ kachasị mma a ga-esi chụsòó ihe ndị ahụ.   Ọ kpọkùzịrị ha ka hadị ike n’ekpere, na-asọpụrụ ọgbụgba ndụ ha na Chineke, ya na ọgbụgba ndụ alumdina nwunye ha, ma na-egosipụtakwa akparamaagwa niile e jiri mara ezi onye nne naezi

Ụka Anglikan achụọla ụkọchukwu anọ maka mmekọ nwoke na nwoke

ỤKA Anglikan dayọsis Isiala Ngwa nke dị na steeti Abia achụọla ndị ụkọchukwu mmadụ anọ maka inwe mmekọ nwoke na nwoke. E gosipụtara nke a site n’akwụkwọ ikike ụgbọ nwa mkpi nke ọ bụ bishọpụ nke dayọsis ahụ bụ Rt. Rev Temple Nwaogu tinyere aka na ya ma bụrụkwa nke e kesara na ngalaba ụka niile dị na dayọsis ahụ. Ụkọchukwu ndị ahụ a chụrụ achụ bụ Rev. Canon Emmanuel Nwankwo, Rev. Kelechi Nwachukwu, Rev. Sunday Azubuike na Rev. Chris Achonye. Ka a chụrụ ha ka a napụkwara ha ikeke ha (licences). Ozi ahụ kwuru na a chụrụ ndị ụkọchukwu ahụ ka e mechara nnyocha site n’aka ndị ọ dị n’aka ma chọpụta na ha na ụmụ nwoke ibe ha na-enwe mmekọ. Ozi ahụ dọkwara ọha na eze aka na ntị gbasara ndị ụkọchukwu ahụ. Bishọpụ Nwogu, onye nke kwetere na a chụrụ ndị ụkọchukwu ahụ n’eziokwu site n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n’ekwentị kwuru na ụka mere ihe o kwesịrị ime maka ichekwa ahụ Kraist. O kwuru sị: “ọ bụ eziokwu. Mana anyị emeela ihe anyị kwesịrị ime dịka ụka. Anyị ezighị ozi ahụ maka mmadụ ọbụla, anya zi