Posts

Showing posts with the label ọrụ ugbo ọkọchị

N’Anambra, Obiano emegheela amụmà ọrụ ugbo ọkọchị

IGBO sị na ọ na-abụ e jide ibe ji n’aka, a sàá agụụ okwu; maka na ọ na-abụ onye rie, ọ mụrịa.   Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụnyaahụ wee gbapee amụmà ịkọ ọrụ ugbo ọkọchị nke ahọ 2020 n’ime steeti ahụ.   Mmemme ịgbape amụmà ọrụ ugbo ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ọrụ gọọmenti, ndị ọrụ ugbo, nakwa  ndị e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị iche iche na steeti ahụ sonyere na ya.   N’okwu ya oge ọ na-agbape ya bụ amụmà ọrụ ugbo, Gọvanọ Obianọ mère ka a mara na ọrụ ugbo so n’otu ihe ọchịchị ya kacha etinye uchu na ya, ma kpọpụtasịkwa ihe dị iche iche ọchịchị ya megoro na ngalaba ọrụ ugbo steeti ahụ kemgbe ọ batara n’ọkwa ọchịchị. Ọ kọwara ọrụ ugbo dịka ihe bara oke uru ma dịkwa oke mkpà na mmepe obodo ọbụla, n’ihi na ọ bụghị naanị na ọ na-enye ego, kama na ọ na-emekwa ka nri na-adị gbàànyụụ oge ọbụla, ma na-akwàlitekwa mmepe obodo.   O kwuru na ya bụ amụmà ịkọ ọrụ ugbo ọkọchị ga-enye aka i