Posts

Showing posts with the label ọrịa korona

Korona: N'India, a na-azọzi ndụ ndị ọrịa n'ụlọ n'ihi na ụlọọgwụ ejula

KA Ọ dị ugbu a, nje korona na-akpazi mkpamkpa na mba India, nke mere na ọtụtụ ndị ọrịa na-anọzi n’ụlọ ebe a na-azọ ndụ ha n’ihi na ụlọọgwụ niile ejula.   Dịka ụlọọgwụ niile dị na Delhi na ọtụtụ obodo ndị ọzọ dị n’India enweghịzi ohere àkwà (bed), ndị mmadụ amaghịkwa ihe ha ga-eme karịa ịkpọ ndị nke ha na-arịa ọrịa korona laa n’ụlọ, ma na-achọzi ọgwụgwọ n’ụzọ ọbụla ha nwere ike.   Ọtụtụ n’ime ha ka e kwuru na ha họrọziri ụzọ akụkụ (black market) ebe ihe niile adịchaghị ka o kwesịrị dịka ọgwụ, ihe okuku ume (oxygen clinders) na ndị ọzọ galara oke ọnụ, tinyere na ọgwụ ndị ahụ edochaghị anya. Ihe na-agala ọnụ nke ukwu n’ụzọ ahụ nke mere na ọtụtụ ndị mmadụ anaghị emeli ihe dị na ya.   N’ihi ọnọdụ a, ọtụtụ ndị mmadụ na-anwụ n’ọnụụzọ ụlọọgwụ n’ihi na ha agaghị azụtali ọgwụ na ihe okuku ume ‘oxygen’ n’ebe ndị ahụ abụghị ụlọọgwụ.   Ụfọdụ ndị ahụ na-ere ihe okuku ume ‘oxygen’ ka e kwuru na ha na-ere ya okpukpu iri ihe e kwesịrị ire ya.   N’akụkụ nke ọzọ, ezinaụlọ ndị ji ego iso ụzọ ahụ na-agbazi

Korona: Egbujiobi ejirila akụrụngwa ahụ ike kwàdo Anambra

N’IJI tụnye soro tụnye ụtụ nke ya ma soro nye aka na mbọ ahụa na-agba imemìlà ọrịa nje korona, otu nwaafọ obodo steeti Anambra bi na mbaUS, ma bụrụkwa onye ma nke ekwe na-akụ na ngalaba ọrụ ahụije, bụ Dọkịta LeoEgbujiobi ebunyela gọọmenti steeti Anmabra akụrụngwa ọrụ ahụ ike ‘BiosafetyLevel 2 Cabinet’ bụ ịgbà, iji kwàdo ilekọta ndị nwere ọrịa ahụ n’ụlọ ahụ ike dịiche iche dị na steeti ahụ.   Akụrụngwa ahụ ike ahụbụ nke ọnụ ego ya dị elu nke ukwuu, ma bụrụkwa nke na-enye aka n’ụzọ pụrụ ichen’ilekọta maọbụ ịgwọ onye butere ọrịa ahụ, ma na-enyekwa aka ichekwaba onye ọrụahụ ike na-elekọta onye bu ọrịa ahụ, ka ya onwe ya wee ghara ibutekxa ya bụ ọrịaọjọọ oge ọ na-enye onye bu ya ọgwụgwọ.   Dịka Kọmishọna na-ahụmaka ahụike na steeti ahụ, bọ Dọkịta Vincent Okpala siri kọwaa, a ga-ebuje ya bụakụrụngwa n’ụlọ ahụ ike ọhaneze dị n’Ọnịtsha, bụ otu n’ime ebe a ga-agape nanso nso a ka ọ bụrụ ebe a ga na-elekọta ma na-agwọ ndị nwere ọrịa ahụ n’imesteeti Anambra.   N’okwu ya nke ya ogeọ na-anabata akụ

Gọọmenti Anambra ga-amalite ijide ụgbọala na imechi ọdụ ụgbọala dara iwu korona

IGBO sị na ọ na-adị mma ibu ụzọ maa ọkwa mmiri tupu ozuzoya, maka na ekwughị ekwu màrà ọnụ, ebe anụghị anụ màrà ntị.   N’ịgbaso nke a, gọọmentisteeti Anambra ekwuola na ọ ga-amalite ịnwụchi ụgbọala na imechi ọdụ ụgbọala dịiche iche na-adịghị erube isi nye iwu ahụ gọọmenti tiri banyere ọrịa njekorona, malite n’izuụka a.   Nke a bụ nke e kwupụtarasite n’ọnụ Kọmishọna na-ahụ maka njem okporo ụzọ na steeti ahụ, bụ Maazị AfamMbanefo, n’ọgbakọ ya na ndị isi òtù dị iche iche jikọtara ndị na-anyà ụgbọalana steeti ahụ nwèrè n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ.   Dịka o siri kọwaa,atụmatụ ọhụụ a bụ nke ọ bụ ndị òtù ahụ na-ahụ maka itinye amụmà iwu korona n’ọrụna steeti ahụ gà-etinyekwa ya n’ọrụ, ma bụrụkwa nke a ga-ejikwa ụlọikpe ngagharịwee na-etinye n’ọrụ, iji na-ekpe ndị dara iwu ahụ ikpe ozigbo a nwụchiri ha.   Ọ kpọkuru ndị nwere ọdụụgbọala dị iche iche na ndị isi òtù jikọtara ndị na-akwọ ụgbọala na steeti ahụka ha kụziere ndị òtù ha ihe ha kwesiri ịma banyere nke ahụ nakwa ntaramahụhụ dịiche ic

N’India, enwe awakpola onye ọrụ ahụike napụ ya ọbara a mitara ndị na-arịa korona

ỌTỤTỤ enwe (troop of monkeys) awakpola otu onye ọrụ ahụikena mba India wee napụ ya ọbara (blood samples) nke ndị bụ ọrịa korona.   Ya bụ ihe dapụtaraka onye ọrụ ahụike (laboratory technician) na-aga n’ogige ụlọakụkwọ ahụike dịna Meerut Lucknow, isi steeti Pradesh na mba India.   Dokinta S.K Garg nkeụlọakwụkwọ ahụ kwuru sị: “Enwe napụrụ  ọbaranke mmadụ anọ na-aria korona bụ ndị nke na-anara ọgwụgwọ, were ha gbalaga. Anyịgara mịrịkwa ọbara ha ọzọ.”   Ndịisi kwuru na haamaghị ma enwe ndị ahụ efesasịrị ọbara ahụ mana ndị mmadụ bi n’okirikiri ụlọakwụkwọahụ na-atụ egwu na-ọrịa korona ga-abawanye ma ọ bụrụ na enwe ndị ahụ ejiri ọbarandị ahụ banye n’ụlọ obibi ndị mmadụ.   Garg kwuru na achọpụtabeghịma enwe ọ ga-ebute korona ma ọ bụrụ na ha na ọbara onye nwere korona metụta.   Enwe na-aga n’ihun’ike n’ike ịbata n’ụlọ obibi ndị mmadụ na India ma na-eweta nsogbu dị icheiche, nke gụnyere ịwakpo mmadụ.   Ndị na-ahụ makagburugburu na-akọwa na imebisi ebe obibi nke ụmụanụmanụ bụ ihe kpatara ụmụanụman

A gaghị eme Imo Awka n'afọ a ka ghara ikesa ọrịa korona – Gọọmenti Anambra

IGBO sị na ọ na-abụ a hụ ihe ka ubi, e ree ọba; ma sịkwa naonye ụlọ ya na-agba ọkụ anaghị achụ oke.   N’ịgbaso nke a, gọọmentisteeti Anambra ekwuwaala hoohaa ma maa ọkwà sị na ya bụ oke mmemme na-ewu èwù ejiri mara ndị Awka bụ isi obodo steeti ahụ, bụ mmemme Imo Awka agaghị ewere ọnọdụn’ahọ a.   Nke a bụ nke e mereka ụwa mara, site n’ozi a kụpụrụ nso nso a n’aha ọchịchị steeti ahụ site n’akaodeakwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobeụ.   Dịka ya bụ ozi sirikọwaa, ọchịchị steeti Anambra mere mkpebì ahụ n’ihi ọrịa nje korona, bụ nkena-akpa mkpamkpa na mpaghara ebe iche iche n’ala Nigeria ugbua, ma na-ebìkwamba ụwa aka ọjọọ n’ụzọ dị iche iche.   O kwuru na ịchịkọbannukwu mmemme dị etu ahụ ugbua adabaghị adaba n’ihi na o megidere ntụziaka ahụòtù ọrụ ahụ ike mba ụwa (bụ World Health Organisation, WHO) na ụlọọrụ ‘NigeriaCenter for Disease Control (NCDC)’ nyere bànyéré igbòchì mgbasà ọrịa korona ahụ,maka na ọtụtụ mmadụ na-adị esonyekarị na mmemme ahụ, bụkwa nke ha na-anọ na yana