Anambra amalitela inye ndị NYSC ọgwụ ịba ọchananya
N’IJI gaa n’ihu n’agha ahụ ọ na-ebu megide mgbasà ọrịa ịba ọchananya n’ime steeti Anambra, ọchịchị steeti ahụ eburula atụmatụ ịgba na ikesà ọgwụ ọrịa ịba ọchananya wee gaa n’ogige ụlọikwuu ebe ahụ ndị ji otu ahọ efe ala nna ha na-anata ọzụzụ n’ime steeti ahụ. Atụmatụ nkesà na ịgba ọgwụ ahụ bụ nke ọ bụ ụlọọrụ ‘Anambra State Primary Health Development Agency’ nọ n’isi ya, ma bụrụkwa nke e sitere na ya wee gbaa imirikiti ndị ahụ ji otu ahọ efe ala nna ha ọgwụ ahụ n’ụlọikwuu ahụ dị n’Ụmụawụlụ/Mbaukwu, n’okpuru ọchịchị ime obodo Awka South, bụ ndị àgbà nke B, nkeji A1 na-anara ọzụzụ n’ebe ahụ ugbua. N’okwu ọ gwara ndị ahụ ji otu ahọ efe ala nna ha n’ebe ahụ, onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra state Primary Health Development Agency’ bụ Dọkịta Chioma Ezenyimulu mere ka a mara na atụmatụ ịgba ọgwụ mgbochi ahụ bụ otu n’ime atụmatụ Gọvanọ Willie Obianọ ji n’aka, iji busoo ọrịa ịba ọchananya na ọrịa ndị ọzọ na-efè èfè agha n’ime steeti ahụ, ma mekwa ka ụmụafọ steeti ahụ nwee ma nọrọ ezi ọnọdụ ahụike bụ