E nyela mmadụ karịrị ótù puku nnyocha maka ọrịa ịbà n'efù
OKE ọñụ dara nnọọ n’isi ngwụcha izuụka gara aga na Nsugbe, dị n’okpuru ọchịchị ‘Anambra East’ na steeti Anambra, dịka mmadụ karịrị otu puku n’ọnụ ọgụgụ nwetàrà nnyòcha ahụ ma natakwa ọgwụgwọ maka ọrịa ịbà n’efù. Inyòcha ahụ na inye ọgwụgwọ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ogige Abito Nsugbe, ma bụrụkwa nke e mèrè n’aha onyeisi ọchịchị obodo ahụ lagoro mmụọ, bụ maazị Frank Owelle. N’okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ịchụ ọrịa ịba ọsọ ụkwụ erughị ala, bụ ụlọ ọrụ ‘Roll Back Malaria’ n’okpuru ọchịchị Anambra East, maazị kwuru na ebumnobi ọrụ obi ebere bụ iji wee belata otu ọrịa ịba si agbasàwanye n’ike n’ike ụbọchị ọbụla. O mere ka a mara na nke ahụ bụ agba nke abụọ ha na-achịkọba ihe mmemme ahụ, bunye ezinaụlọ maazị Frank Owelle na ndị òtù isi ọchịchị obodo ahụ, bụ ‘Nsugbe Development Union’ maka ịtụpụta na ịkwàdo ọmarịcha atụmatụ ahụ, bụ nke o kwùrù na o nyela aka n’ụzọ pụrụ iche n’ibibì na imeṅémìlà ọrịa ịbà n’obodo ahụ. Na ntụnye nke ya, onyeisi oche nchere oge òtù ‘Nsugbe D