Posts

Showing posts with the label ọnwa asatọ

Mmemme ọnwa asatọ na uru dị na ya

ỌNWA a bụ ọnwa asatọ, ọtụtụ ihe ọma na-eme na ya ọ kachasị n’ala Igbo. Nke mbụ, ọnwa asatọ ka Igbo niile ji eme mmemme ịwa ji maọbụ iri ji dịka ndị si asụ. Mmemme a na-akpọlata ndị Igbo ụlọ I soro ibe ha n’oriri ji ọhụụ. Ọnwa asatọ bụ oge ndị Igbo ji enwe obi ụtọ. N’oge ọnwa asatọ, ụfọdụ na-akpọ ndị enyi ha bịa soro ha ńụrịa na Chukwu emewokwa ka ha gbaa afọ ọzọ.   N’oge ọnwa asatọ a, ụfọdụ obodo ji ya edozi ọtụtụ ihe na be ha. Ọnwa asatọ bụ mgbe e ji amụ ndị eze, ndị na-echepụta ihe dị mma, ndị nwere uche zuru oke, ndị na-eji nwayọ ahazi ihe.   Mmemme ọnwa asatọ ọzọ a na-eme bụ mgbe ụmụnwaanyị ji e gosipụta na ha sokwa n’ihe a na-eme. Ụmụnwaanyị, ọnọ n’ụlọ na ọnọ na mba na-enwe ọgbakọ pụrụ iche. N’ọnwa asatọ, ụmụnwaanyị Igbo na-ejeru obodo ha dị iche iche. Ọ bụkwa mgbe ụmụnwaanyị ji eleba anya na mmepe obodo ha, ọ bụkwa mgbe ha ji ahazi ụfọdụ ihe adịghị dịka o kwesịrị.   Ụmụnwaanyị jikwa oge ahụ eleba anya n’ọganihu nke ụlọụka dị n’obodo ha, ụlọọgwụ ebe a na-amụ nwa dị n’obodo ha nakw