Ndị mmadụ ka na-anwụrịrị maka ọkụ ọgbụgba ahụ dapụtara n' Abia
E KWUOLA na ọnụọgụ ndị nwụrụ na ya bụ ọkụ ọgbụgba dapụtara na steetị Abia n’izuụka gara aga eruola otu narị mmadụ na iri ise. Ọ bụ Eze Ikechukwu Chiavoghilefu, onye isi oche ndị eze ọdinala n’okpuru ọchịchị Osisioma, ebe ya bụ ọkụ ọgbụgba ‘pipeline explosion’ dapụtara kwuru nke a. Dịka Eze Chiavoghilefi siri kwu, imirikiti ndị mmadụ, ndị meruru ahụ n’ihi ọkụ ọgbụgba ahụ na-anwụ n’ike n’ike. Ọ rụtụrụ aka na n’ime otu ụlọ ahụ ike e bugara mmadụ ruru iri asaa, mana n’ime awa iri abụọ na anọ (otu ụbọchị) mmadụ karịrị iri atọ n’ime ha nwụrụ. Onye eze a kwuru nke a oge onye na-anọchite ha n’ụlọ nzukọ sineti bụ Theodore Orji wụchara n’ebe ahụ iji kasie ndị nke a metụtara obi. Eze ahụ kwuru si, “ihe dịka mmadụ iri asaa bụ ndị ọkụ gbara ka e bụgara n’ụlọ ahụike dị n’akụkụ ụlọ m n’ụbọchị mbụ ya bụ ihe mere mana ugbua, ha nile a bụrụla ndị nwụrụ anwụ. Ihe ruru otu narị mmadụ na iri ise anwụọla ka ọ dị ugbua.” Ọ gara n’ihu kwuo na ha nọ n’ọgba aghara n’ihi ọnwụ ahụ nke ka na-agarịrị n’ihu n’ihi ok