NDLEA anwụchiela ọtụtụ mmadụ maka ọgwụike

Izunna Okafor dere ozi a N'ỊGA n'ihu n'ịchụ ọgwụ ike ọsọ ụkwụ erughịa ala, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịñụ, ịkpọ maọbụ ịtụ mgbere ọgwụ ike n'ala Nigeria a mara dịka 'National Drug Law Enforcement Agency, NDLEA' (ngalaba nke Abuja) anwụchiela ọtụtụ mmadụ maka itinye aka n'ihe metụtara ọgwụ ike. Onye na-ahụ maka mgbasa ozi na ngalaba ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Femi Babafemi bụ ya kwupụtara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ n'Abuja, bụ isi ala Nigeria, bụ nke o sitere na ya wee mee ka a mara na ndị ahụ gụnyèrè ma ụmụnwoke ma ụmụnwaanyị. O mere ka a mara na ọ bụ oge ndị ọrụ NDLEA ahụ wakpòrò ebe ndị ahụ na-ezo na ebe ha nọ were akụ ajọ akụmakụ ha ka e jiri wee nwụchie ha. Dịka o siri kọwaa, ndị ahụ a nwụchikọrọ na nsonso a na-esi n'usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ dị iche iche wee na-eresi ndị mmadụ ihe oriri dị iche iche e jiri ọgwụ ike wee mee. Ọ gara n'ihu nye aha ndị ahụ a nwụchikọrọ dịka Queen Nvene, Collins Ozo