Posts

Showing posts with the label ọgwụ ike

Ọghọm dị na-ịse ọgwụ ike na anwụrụ ike

ỌGWỤ ike na anwụrụ ike bụ ihe ọjọọ na echere ụmụ ntorobia aka mgba na mba ụwa nile. Ihe ndị a etinyego kwa anya mmiri n’anya ọtụtụ ezinaụlọ ma mekwa ka ụfọdụ ezinaụlọ gbara aka otu nwa nwoke ha nwere.   Ọgwụ ike na anwụrụ ike bụkwa ihe kpatara ụfọdụ ụmụ ikorobia jiri gbara ọtọ na ejehari na ezi nakwa ama nile na oge ugbua. Ọtụtụ nime ha bụkwa ndị ndị mụrụ ha ji ego ma gụkwa akwụkwọ. Ụfọdụ ụmụ ikorobịa ndị a ka ndị mụrụ ha zipụrụ obodo oyibo iga gụọ akwụkwọ ma ọ bụ iga me ihe ọzọ bara uru ma taa, ha bụzị ndị gba ọtọ na agagharị.Ha a baazịghị uru nye ndị nne na nna ha ma ọ bụ ala ha.A gụpụghị ụmụ agbọghọ n’okwu a.   Ụzọ ụfodụ ụmụ ntorobịa ndị a si adaba na ndụ ọjọọ a bụ site n’aka ndị ha na ha bi n’obodo mepere emepe. Ndị na akpọkarị nke ọkpụkpọ bụ ndị si obodo oyibo.Ndị a bụ ndị e zigara ka ha ga baara onwe ha uru site na ịgụ akwụkwọ. Ụfọdụ bụ ndị e zipuru ka ha jee lụọ ọlụ ma nweta ego, ha rue ebe ahụ, họpụtara onwe ha ụzọ ọjọọ dị otu a . Ụfọdụ, n’ihi na ha amaghị ihe ọjọọ dị iche ọ na

Ọghọm dị n'ịkpọ ọgwụ ike, ise anwụrụ ike

ỌGWỤ ike na anwụrụ ike bụ ihe ọjọọ na-echere ụmụ ntorobia aka mgba na mba ụwa niile. Ihe ndị a etinyegokwa anya mmiri n’anya ọtụtụ ezinaụlọ ma mekwa ka ụfọdụ ezinaụlọ gbara aka otu nwa nwoke ha nwere.   Ọgwụ ike na anwụrụ ike bụkwa ihe kpatara ụfọdụ ụmụ ikorobia jiri gbara ọtọ na-ejeghari n’ezi nakwa ama niile n’oge ugbu a. Ọtụtụ n’ime ha bụkwa ndị ndị mụrụ ha ji ego ma gụkwa akwụkwọ. Ụfọdụ ụmụ ikorobịa ndị a ka ndị mụrụ ha zipụrụ obodo oyibo ị ga-gụọ akwụkwọ ma ọ bụ ị ga-mee ihe ọzọ bara uru, ma taa ha bụzị ndị gba ọtọ na-agagharị.Ha abazịghị uru nye ndị nne na nna ha ma ọ bụ ala ha. A gụpụghị ụmụ agbọghọ n’okwu a.   Ụzọ ụfodụ ụmụ ntorobịa ndị a si adaba na ndụ ọjọọ a bụ site n’aka ndị ha na ha bi n’obodo mepere emepe. Ndị na-akpọkarị nke ọkpụkpọ bụ ndị si obodo oyibo.Ndị a bụ ndị e zigara ka ha ga baara onwe ha uru site n’ịgụ akwụkwọ. Ụfọdụ bụ ndị e zipuru ka ha jee lụọ ọlụ ma nweta ego, ha rue ebe ahụ, họpụtara onwe ha ụzọ ọjọọ dị otu a. Ụfọdụ, n’ihi na ha amaghị ihe ọjọọ dị iche ọ

Ọgwụ ike: Aka NDLEA akparala mmadụ ise n'Abuja

N’ỊGA n’ihu n’ịchụ ọgwụ ike ọsọ ụkwụ erughịa ala, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịñụ, ịkpọ maọbụ ịtụ mgbere ọgwụ ike n’ala Nigeria a mara dịka ‘National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA)’ ngalaba nke Abuja anwụchiela mmadụ ise maka itinye aka n’ihe metụtara ọgwụ ike.   Onye na-ahụ maka mgbasa ozi na ngalaba ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Femi Babafemi bụ ya kwupụtara nke a site n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ n’Abuja, bụ isi ala Nigeria, bụ nke o sitere na ya wee mee ka a mara na ndị ahụ gụnyèrè ma ụmụnwoke ma ụmụnwaanyị.   O mere ka a mara na ọ bụ oge ndị ọrụ NDLEA ahụ wakpòrò ebe ndị ahụ na-ezo na ebe ha nọ were akụ ajọ akụmakụ ha ka e jiri wee nwụchie ha.  Dịka o siri kọwaa, ndị ahụ a nwụchikọrọ na nsonso a na-esi n’usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ dị iche iche wee na-eresi ndị mmadụ ihe oriri dị iche iche e jiri ọgwụ ike wee mee.   Ọ gara n’ihu nye aha ndị ahụ a nwụchikọrọ dịka Queen Nvene, Collins Ozoemena, Samson Peter, Chika Nvene, na Habila Musa; ma kwuo na ha na-ere ihe ahụ na m

E jidela mmadụ iri atọ na ise n'Anambra maka ọgwụ ike

SITE na njikọaka ọnụ nke ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ọgwụ ike n’ala Nigeria, bụ ‘National Drug Law Enforcement Agency’ (NDLEA), ndị ọrụ agha ala anyị, ndị uwe ojii, ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ, ndị ụlọ ọrụ na-ahụ maka mbàtá na ọpụpụ n’ala anyị, bụ ‘Nigerian Immigration Service’ na ndị ndị ọrụ nchekwa mmadụ nkịtị, bụ ‘Nigeria Security and Civil Defence Corps’ a nwụchikọọla mmadụ iri atọ na ise a na-enyo ènyò na ha na-etinye aka n’ihe metụtara ọgwụ ike. Ndị a bụ ndị e jidere site na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ, nke gụnyere Nnewi, Ọkịja, Obosi, ọdụ ụgbọala Ihiala, nke Aba, nke Owerri, nke Lagos, nke Benin. Ihe ndị e nwekọtakwara n’aka ha gụnyere ọgwụ Cannabis sativa, ọgwụ Cocaine na ọgwụ ike Heroine. N’okwu ya bànyere nke ahụ, onyeisi ụlọ ọrụ NDLEA na steeti ahụ, bụ maazị Sule Momodu mere ka a mara mbọ pụrụ iche ha na-agba iji busoo ịkpọ, ịñụ ma ọ bụ ịtụ mgbere ọgwụ ike agha na ya bụ steeti ahụ, ma kwuo na nke ahụ na-aga n’ihu n’ịmịta ezi mkpụrụ a tụrụ anya, ọ kachasị ugbu

NDLEA ejidela mmadụ iri abụọ maka ọgwụ ike n'Anambra

N’ỊGBASÒ mkpebì ya imemìla ịkpọ ma ọ bụ ịtụ mgbere ọgwụ ike n’ala anyị, ụlọ ọlụ ahụ a mà àmá n’ibu agha megide ọgwụ ike, bụ ‘National Drugs Law Enforcement Agency’ (NDLEA),  anwụchikọọla mmadụ iri abụọ a na-enyo ènyò na ha na-atụ mgbere ọgwụ ike na steeti Anambra. Onyeisi ụlọ ọlụ ahụ na steeti Anambra, bụ Maazị Sule Momodu mere ka a mara nke a n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụbọchị Tuzdee n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ. Dịka ọ bụ ihe a ma ama na a dịghị aka àkà eje nta agwọ, Maazị Momodu kwùrù na ndị ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ na ngagharị mberede ndị otu ụlọ ọrụ ahụ mere nso nso a na steeti ahụ, na nkwadobe maka nhọpụta izùgbe na-abịa n’ihu. O kwùrù na mkpocha na nzàcha ahụ e mere bụ nke dabàrà adabà nnọọ, n’ihi mkpùghe ahụ e kpùghèrè na ụfọdụ ndị na-egwu okwe ndọrọ-ndọrọ ọchịchị na-enyegasị ndị ntorobịa ọgwụ ike n’oge dị ugbu a, ka ha wee ñụọ, chefùo onwe ha ma kpaa aghara ma ọ bụ nwekwa ike ịbàgide n’ọtụtụ ihe dị iche iche na-ebute nsògbu n’oge nhọpụta. O jiri ohere ahụ dọọ ndị na-egwu ok