N'Anambra, ihe mberede okporoụzọ egbuola otu onye ọgbatumtum ụkwụ atọ
IHE mberede okporoụzọ ọzọ adapụtakwala na steeti Anambra, madulaa otu onye mmụọ n’oge erughị eru, ebe ụfọdụ ndị ọzọ nwètàkwara mmerụahụ n’ụdịdị iche iche. Maazị PaschalAnigbo, bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta oheneze na ụlọọrụ ‘Federal Road SafetyCorps (FRSC)’ na steeti Anambra bụ ya mèrè ka ụwa mara nke a site n’ozi ọ kụpụrụbànyere ya. O mere ka a mara naihe mberede ahụ bụ nke mere na njikọ ụzọ Kwata (bụ ‘Kwata Junction’ n’asụsụbekee) dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, na mpaghara ụzọ awara-awara ahụ siriEnugu gaa Ọnịtsha, oge ọ fọdụrụ nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere ise nke ụtụtụ. Dịka o siri kọwaa,ya bụ ihe mberede dapụtara oge otu onye na-anyà nnukwu ụgbọala Típà (nwéréákàrà AKL325ZT) nupùrù isi nyegara ọkụ ahụ n’ekwu mgbe ndị ga-aga na mgbe ndịagaghị aga n’okporoụzọ (bụ Traffic Light n’asụsụ bekee); o wee jirizie oke ọsọkwofèrè (n’oge na ebe o ekwesighị ịgafè mgbe ahụ), wee kwọrikọọ ótù ọmarịchaKeke ọhụụ (nwéré akàrà HTE159VC) bụ nke na-agafère onwe ya n’akụkụ okporoụzọnke ọzọ.