Posts

Showing posts with the label ọdụụgbọelu Anambra

Mmepe dị egwu ga-eso ọdụụgbọelu Anambra

ỌDỤỤGBỌELU bụ nnukwu ihe ọma mere na steeti Anambra na nsonso a. O teela aka e ji tụba anya ya maka na o kwesịrị ka Anambra nwee ọdụụgbọelu n’ihi na ihe onye ruru ogo ya abụghị ụsa.   Steeti Anambra dịka anyị maara, bụ steeti e ji ịzụ ahịa mara. O nwere nnukwu ahịa dị iche iche ndị gụnyere Onitsha Main Market, Nkwo Nnewi, Eke Awka w.d.g. Ọtụtụ ndị ahịa na-esi steeti a gaa steeti ọzọ ebe ha ga-aba ụgbọelu gaa ebe ha na-azụ ahịa.   Otu o sila dị, ọchịchị Gọvanọ Willie Maduaburochukwu Obiano emeela ka ihe dị wọrọ ogeri zụọ n’ahịa. Ka ọ dị ugbu a, e nweela ọdụụgbọelu n’Umueri nke na ndị mmadụ, ọ bụghị sọọsọ ndị na-azụ ahịa ga na-esizi na ya eme njem.   Ọdụụgbọelu na-eweta mmepe dị egwu n’obodo ọbụla e hibere ya. N’ihi nke a, nke Anambra agaghị adị iche. Mmepe ga-esokwa ya bata n’ebe ọ dị ukwuu.   N’okwu ya, otu onye Anambra aha ya bụ Michael Anozie kwuru na ọtụtụ ihe ọma ka ọdụụgbọelu a ga-eweta. O kọwara na ọ ga-adị mma ka ndị mmadụ bido were ya kpọrọ ihe, ka ndị nwere ọwara ụgbọelu (airl