Posts

Showing posts with the label ọdụ ụgbọelu Enugu

Ọrụ amalitekwala ọzọ n'ọdụ ụgbọelu Enugu

N’AGBANYEGHỊ mmechi e mechiri ọdụ ụgbọelu n’ala anyị n’ihinsogbu korona, ọrụ amalitekwala n’ọdụ ụgbọelu Akanu Ibiam InternationalAirport, Enugu.   Ọ bụ Minista na-ahụmaka njem ụgbọelu (Minister of Aviation) Captain Hadi Sirika kwuputara nke ahụna Monde. O kwuputakwara na a ga-agwa ọha mmadụ mgbe a ga-emepekwa ọdụ ụgbọeluahụ, mgbe adịghị anya.   O kwuru sịn’agbanyeghị ọnọdụ a nọ n’ime ya ugbu a n’ihi korona (lockdown), ọrụamalitekwala ọzọ n’ọdụ ugboelu ahụ.   N’agbanyeghị iheiche aka mgba dịka mmiri ozizo na ndị ọzọ na ha ga-eweta ọrụ ahụ na njedeben’izuụka olemole na-abịanụ. Ọ gara n’ihu kọwaa na ọ ga-ekwuputa kpọmkwem mgbeha ga-eweta ọrụ ahụ na njedebe na njem ọzọ ọ ga-abịa.   Sirika onye nke yana onyeisi Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN) Captain Raibu Yadudu jiụgbọelu (Police Chopper) wee wụcha ọdụ ụgbọelu ahụ kọwara na ọrụ ahụ e ji n’akaebe ahụ ma bụrụ nke na-agwụzi agwụ bụ nke a karala iweta na njedebe ma ọ bụghịna ndị ọrụ lara ụlọ ka ha na ezinaụlọ ha nọọ n’ihi nsogbụ k