Posts

Showing posts with the label ọchịchị onye kwuo uche

Mbụgharị Nigeria bughàrịrị ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya

KA Ọ dị taa, ọ bụghụzị akụkọ ọhụrụ na ala Nigeria ebugharịala mgbe e ji emerùbezị ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya. Ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya bụ oke ụbọchị pụrụ iche n’ala Nigeria, n’ihi na ọ bụ ncheta ụbọchị ọchịchị ndị nkịtị laghachitakwara azụ n’ala ahụ, ka ọ gachara afọ kwùrú afọ ndị agha weghààra ọkwa. Nigeria, dịka mbà nwèèrè onwe ya pụọ n’aka ọchịchị ndị ọcha n’abalị mbụ nke ọnwa nke iri n’afọ 1960, bụ oge ụmụafọ Nigeria wèghàrà ọkwa ọchịchị ala ha. Ka ọ gachara mkpụrụ afọ ole na ole nke ahụ mechàrà (Jenụwarị 15th1966), ndị agha ala anyị gbawara ndị nkịtị aka, ma weghara ọkwa ọchịchị. Ọchịchị ndị agha ahụ bụzị nke dịgidere gachaa ogologo afọ niile a lụrụ agha Nigeria na Biafra (1966-1970) wee ruo n’afọ 1979, bụ mgbe ọchịchị ndị nkịtị laghàchikwàrà azụ n’ihi nhọpụta izugbe e mere, bụ nke Maazị Shehu Shagarị na Dọkịta Alex Ekwueme nọrọ na ya wee tute ùgò dịka onyeisi ala na òsòte onyeisi ala n’ótù n’ótù. Nke ahụ bụ nke ùgbòrò abụọ ndị nkịtị na-ewèghara ọkwa ọchịchị ala Nige