Posts

Showing posts with the label Ọrịa 'Lassa Fever'

Ọrịa 'Lassa Fever' ebidola ọzọ na Nigeria

NDỊ ụlọ ọlụ ‘Nigeria Centre for Disease Control’ ekwuputala na ọrịa ‘Lassa Fever’ agbasakwala na ala anyị bụ Nigeria. Ha kwuputara nke a n’ihi ọtụtụ ọnụọgụ ndị na-arịa ya bụ ọrịa bụ ndị nke a chọpụtara kemgbe afọ a na steeti dị iche iche. Dọkịnta Chinwe Ihekweazu, onye isi  NCDC bụ onye kwuputara nke a n’Abuja kwuru si: “A chọpụtara na ọrịa ‘Lassa Fever’ na-abawanye site n’ozi nke si na steeti dị iche iche n’ala anyị kemgbe mbido afọ a. Mgbe ọnwa Jenụarị dị n’abali iri na atọ ka a achọpụtara na mmadụ iri isii na-arịa ya bụ ọrịa na steeti asatọ.” Ihekweazu gara n’ihu kwuo na ọ bụ site n’ ozi ndị si steeti dị iche iche gbasara ọrịa ahụ ka ‘Nigeria Centre for Disease Control’ (NCDC) ji kwuo na ya bụ ọrịa agbasaala. Ọ gakwara n’ihu kwuo na eguzobego otu ọlụ ‘Emergency Operations Centre’ (EOC) iji buo agha megide ọrịa ahụ. Ọ rụtụrụ aka na EOC gụnyere ‘World Health Organisation’ (WHO), US Centre for Disease Control’ na ọtụtụ ndị ọzọ.