Ndị Nri emeela emume Ọnwa Agwụ ahọ 2021
Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ n’obodo Nri dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Anaọcha nke steeti Anambra, dịka ya bụ nnukwu obodo merụbèrè emume Ọnwa Agwụ nke ahọ 2021. Ya bụ óké mmemme dọtàrà ọtụtụ ndị dị iche iche ihe omenala na-amasị, ndị eze ọdịnala na ndị ọzọ sitere ebe dị iche iche wee bịa isonyere obodo ahụ bụ isi ala Igbo wee mee ya bụ mmemme. Emume Ọnwa Agwụ bụ mmemme dịbara gboo e jiri mara Nri, ma bụrụkwa nke a na-eme n’ahọ ọbụla, n’ọnwa Juunu maọbụ ọnwa Julaị kwà ahọ, dàbere na mgbe ọ dabàrà. Ọ bụ mgbe a kụnyechara mkpụrụ n’ubi ka a na-eme ya bụ mmemme a na-eji mmanwụ dị iche iche were eme, iji kpee ekpere maka ihe a kọrọ n’ugbo, ka o wee mepụta ihe nke ọma, buchàpụ ma chụtèé ihe ọdachi maọbụ ihe ogbochi ọbụla aka, gọzie obodo ahụ ma nwekwa añụrị. Kemgbe ọtụtụ ahọ gara aga, ọ bụ ndị Nri na ụlọọrụ na-emepụta mmanya n’ala Nigeria a kprọ ‘Nigerian Breweries Plc’, bụ ndị na-emepụta mmanya ‘Life Beer’ na ọtụtụ mmanya ndị ọzọ nà-ejikọ aka ọnụ were eme emume Ọnwa Agwụ, n’ihi ezi m