Ọnwụ na akwamozu n'ala Igbo: Oge mbụ na oge ugbua
AKWAMOZU bụ e mee nwata ka e mere ibe ya. Ọ bụ otu n’ime emume zuru ụwa ọnụ ma bụrụkwa mmemme zuru ọnwa na ahọ ọnụ, maka na ụwa bụ ahịa na-azụ kwa ụbọchị; ndị na-eje eje ndị a na-ala ala. Akwamozu bụ ùgwù ikpeazụ a na-akwanyere onye nwụrụ anwụ na emume ikpeazụ a na-emere ya iji sị ya gaa ije ya nke ọma. Nke a bụ n’ihi na ọ bịara ije ga-alarịrị ala, ụdị ogologo ọ sọkwara ije ya too; maka na o nweghị onye ga-epu ome n’ụwa a. Ndị ọbụla, ọbụnadị ndị Awụsa na ndị ọcha na-emegbàdo emume akwamozu maka na anwụọ elighị elu na-ebute anwụba ebighị ebi. Ọ bụ eziokwu na ndị ọbụla na agbụrụ dị iche iche nwere etu ha si eme nke ha, mana etu ọbụla e siri mee ya, ihe adịghị mgbagha bụ na a kwaala ozu. N’ala Igbo, a hụtara akwamozu dịka mmemme ‘ọ bụ m ka ọ bụ gị?’ maka na ebe onye na-akwa mmadụ ka ọ na-akwa onwe ya. Òkù ọnwụ bụ mgbe chi onye ụwa jiri kpọọ ya maka na ụwa bụ ahịa, onye zụchaa nke ya ọ laa. Onweghịkwa onye maara oge nke ya ga-abụ. Ọbụnadị ndị chere na ha na-ahụ ụzọ apụghị ịhụ mgbe ha g