Posts

Showing posts with the label Ọnwụ

Ọnwụ na akwamozu n'ala Igbo: Oge mbụ na oge ugbua

AKWAMOZU bụ e mee nwata ka e mere ibe ya. Ọ bụ otu n’ime emume zuru ụwa ọnụ ma bụrụkwa mmemme zuru ọnwa na ahọ ọnụ, maka na ụwa bụ ahịa na-azụ kwa ụbọchị; ndị na-eje eje ndị a na-ala ala.   Akwamozu bụ ùgwù ikpeazụ a na-akwanyere onye nwụrụ anwụ na emume ikpeazụ a na-emere ya iji sị ya gaa ije ya nke ọma. Nke a bụ n’ihi na ọ bịara ije ga-alarịrị ala, ụdị ogologo ọ sọkwara ije ya too; maka na o nweghị onye ga-epu ome n’ụwa a. Ndị ọbụla, ọbụnadị ndị Awụsa na ndị ọcha na-emegbàdo emume akwamozu maka na anwụọ elighị elu na-ebute anwụba ebighị ebi. Ọ bụ eziokwu na ndị ọbụla na agbụrụ dị iche iche nwere etu ha si eme nke ha, mana etu ọbụla e siri mee ya, ihe adịghị mgbagha bụ na a kwaala ozu.   N’ala Igbo, a hụtara akwamozu dịka mmemme ‘ọ bụ m ka ọ bụ gị?’ maka na ebe onye na-akwa mmadụ ka ọ na-akwa onwe ya. Òkù ọnwụ bụ mgbe chi onye ụwa jiri kpọọ ya maka na ụwa bụ ahịa, onye zụchaa nke ya ọ laa. Onweghịkwa onye maara oge nke ya ga-abụ. Ọbụnadị ndị chere na ha na-ahụ ụzọ apụghị ịhụ mgbe ha g

Ọnwụ na akwamozu n'ala Igbo: Oge mbụ na oge ugbua

Akwamozu bụ e mee nwata ka e mere ibe ya. Ọ bụ otu n’ime emume zuru ụwa ọnụ ma bụrụkwa mmemme zuru ọnwa na ahọ ọnụ, maka na ụwa bụ ahịa na-azụ kwa ụbọchị; ndị na-eje eje ndị a na-ala ala.   Akwamozu bụ ùgwù ikpeazụ a na-akwanyere onye nwụrụ anwụ na emume ikpeazụ a na-emere ya iji sị ya gaa ije ya nke ọma. Nke a bụ n’ihi na ọ bịara ije ga-alarịrị ala, ụdị ogologo ọ sọkwara ije ya too; maka na o nweghị onye ga-epu ome n’ụwa a. Ndị ọbụla, ọbụnadị ndị Awụsa na ndị ọcha na-emegbàdo emume akwamozu maka na anwụọ elighị elu na-ebute anwụba ebighị ebi. Ọ bụ eziokwu na ndị ọbụla na agbụrụ dị iche iche nwere etu ha si eme nke ha, mana etu ọbụla e siri mee ya, ihe adịghị mgbagha bụ na a kwaala ozu.   N’ala Igbo, a hụtara akwamozu dịka mmemme ‘ọ bụ m ka ọ bụ gị?’ maka na ebe onye na-akwa mmadụ ka ọ na-akwa onwe ya. Òkù ọnwụ bụ mgbe chi onye ụwa jiri kpọọ ya maka na ụwa bụ ahịa, onye zụchaa nke ya ọ laa. Onweghịkwa onye maara oge nke ya ga-abụ. Ọbụnadị ndị chere na ha na-ahụ ụzọ apụghị ịhụ mgbe ha g

Ọnwụ nwakwụkwọ UNIZIK ebutela akụkọ dị iche iche

Iwe na ọnụma e ju ụmụakwụkwọ obi Izunna Okafor dere gere nke a   DỊKA a sị na mmadụ nwụọ, akụkọ ya ejupụta ụwà n’ọnụ; akụkọ dị iche iche esochiela ọnwụ obere Maazị Francis Chinedu Mmadubụobi,nwata akwụkwụkwọ Mahadum Nnamdị Azikiwe dị n’Awka azụ, dịka ụmụakwụkwọ mere ngagharị iwe banyere ọnwụ mberede ahụ. Nwata ahụ, bụ onye a sị na ọ nọ n’ogo nke ikpeazụ ya, ma bụrụkwa onye ọ fọdụụrụ naanị otu ule ka agụmakwụkwọ ya kụrụ ọnụ na mahadum ahụ, wee bụzụrie onye zutere ọnwụ mberede ya n’isi ngwụcha izu ụka gara aga. Ọnwụ ike ahụ, ihe gbasaara ya, na otu o siri wee mee, bụzị nke mere ka ụmụakwụkwọ niile nọ na mahadum ahụ wee nuputa n’ìgwe mee ngagharị iwe iji gosi na obi adịghị ha mma chaa chaa banyere otu ndị isi ụlọ akwụkwọ ahụ si eleghàra ihe ụfọdụ ha kwesiri ime anya, ọ kachasị ihe metụtara ọnwụ na ndụ. Na ngagharị iwe ahụ nke weere ọnọdụ ụbọchị Mọnde n’isi ụlọ akwụkwọ ahụ, a hụrụ ụmụakwụkwọ ahụ ka onye ọbụla n’ime ha yicha akwa ojii, zukọọ n’igwè, buru akwụkwọ e dere ihe dị iche iche na n