Ọlụ aka bara nnukwu uru na ndụ mmadụ
Chinwendu Uzoatu ỌLỤ aka bụ ihe mmadụ na-arụpụta n’onwe ya, nke o ji aka ya arụ. Onye na-arU ọrụ aka na-anọ n’ọrụ mgbe ọ bụna makana ọrụ ya na-abụkari ọrụ ndị mmadụ na-achọ. E nwere ọrụ aka dị iche iche dịka: ịkwa nka, ịkọ ugbo, isi nri, idozi isi, ido ụlọ, ịkpụ bụlọọkụ, iru kapịnta, ighe akara, ise agidi, ịkwa akwa, wdg. Onye ọ bụna tinyere aka n’ọrụ ndị a na-enweta ego mgbe nile ma were ya na-egbo mkpa diịrị ya. Ọtụtụ ndị mmadụ esila n’ọrụ aka dị iche iche mepụta ihe ma sorokwa na ndị obodo jiri biri. Ha esina na ya rụọ ụlọ, lụọ nwanyị ma zụlite ụmụ ha n’ogo dị iche iche. Ọtụtụ ndị mmadụ esikwala n’irụ ọlụ aka wee wulite nnukwu ụlọ ebe a na-emepụta ngwa ahịa dị iche iche. Ụfọdụ sikwa na ya mụbaa site n’iga n’ihu na ngalaba ndị ọzọ dị iche iche. Otu nwoke malitere ndụ ya site n’ịkwa tụrọkụ. Mgbe o mere nke a afọ ole na ole, ọ malitere zụtba ụgbọala nke ndị mmadụ na-anyara ya wee na-ebu ndị njem. Otu a ka nwoke a si mechaa bụrụ onye a maara aha ya n’ihe gbasara ụgbọala na-ebu ndị nje