Ọkụ agbagbuola nwaanyị, ụmụ ya atọ n'Ebonyi
OTU nwaanyị aha ya bụ Chigozie Onuobu, na ụmụ ya atọ abụrụla ndị ọkụ gbaworo n’ụlọ akịrịka ha, n’Aguabata Echera nke dị n’okwuru ọchịchị Ikwo na steeti Ebonyi. Otu onye ogbe ahụ nke achọghị ka a kpọọ aha ya gwara ndị nta akụkọ na ọkụ ọgbụgba ahụ nke ji ime abalị wee gba bụ nnọọ nke amatabeghị ihe kpatara ya. O kwuru sị: “Anyị amaghị otu ọkụ ahụ siri malite. Ọ gbagwojuru anya otu o siri bụrụ sọọsọ ụlọ ya ka ọkụ gbara. O nweghị ihe dị n’ụlọ ahụ pụtaranụ.” Otu o sila dị, otu onye ezinaụlọ ahụ, Maazị Samuel Okoro bụ onye kwuputara na ya bụ ọdachị mere eme n’ezie kwuru na ya agaala ebe ahụ ma rụtụ aka na ọkụ ọgbụgba ahụ bụ ihe a kpachapụrụ anya mee n’ihi na enweghị ebe ọhịa gbara ọkụ n’okirikiri ebe ahụ. O kwuru sị: “Echeghị m na ọbụghị ihe a kpachara anya me. Onweghị ihe gosịrị ọhịa ịgba ọkụ n’okirikiri ụlọ ahụ. Ọzọkwa, ha nwere usekwu (kitchen) a rụpụrụ iche, nke bụ ebe ha na-esi nri. Nwaanyị ahụ lụrụ nwaanyị abụọ, mana nwaanyị nke izizi ebinyeghịrị ha. A nụrụ na oge ndị mmadụ k