Posts

Showing posts with the label Ọgwụ mgbochi korona

Singapore ga-amalite ịgba ụmụaka ọgwụ mgbochi korona

SINGAPORE ekpebiela ịmalite gbaba ụmụaka na-agụ akwụkwọ ọgwụ mgbochi korona nsonso a. Ọ bụ na Monde ka onyeisiala mba ahụ Lee Hsien Loong kwuputara nke ahụ, ka ndị ọkacha mara kọwara na korona ndị ọhụrụ na-emetụta ụmụaka karịa.   Mba ahụ nọ n’oge gara aga lebaa anya eleghị anya n’azụ n’igbochi ajọ ọrịa ahụ site n’ịmechi ụlọakwụkwọ ka ha chọpụtara site ọgbara ọhụrụ ya, dịka nke a dị na mbụ hụta n’India, kacha emetụta ụmụaka n’ọnụọgụ dị ukwuu.   N’okwu ya nke e gosiri n’onyoonyoo tiivii, Onyeisiala Loong kwuputara na ụmụakwụkwụ site n’afọ iri na abụọ gbagoo ga-abụ òtù ọzọ a ga-agba ọgwụ mgbochi.   O kwuru sị: “Na nke ikpeazụ ọ bịara, anyị ahụla ọtụtụ ụmụaka ọ na-emetụta, n’ụlọakwụkwọ ma n’ogige ‘tuition’. Ụmụaka ndị ahụ anaghị arịa ọrịa dị egwu mana nne na nna ha nọ na mgbagwoju anya na mwute. Ya mere, anyị ga-eji ohere ezumike Juunu gbaa ụmụakwụkwọ ọgwụ mgbochi.”   A gbacha ụmụakwụkwọ ọgwụ mgbochi, ndị ọ dị n’aka ga-agbaba ndị okenye, site n’afọ iri atọ na iteghete wee gbadaa.  Long gar

A kpọkuola ndị Anambra ka ha pụta gbaa ọgwụ mgbochị korona

A KPỌKUOLA ma dụọ ndị Anambra ọdụ ka ha leghara asịrị anya, debanye aha ha, ma sonyesie ike n’ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa korona ahụ a maara dịka ‘Oxford-Astrazeneca’ bụ nke a na-gba n’ime steeti ahụ ugbua, n’ihi na o nweghị mpụtara ọjọọ ọbụla o nwere.   Oku a bụ nke a kpọrọ site n’ọnụ onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Primary Health Care Development Agency (ASPHCDA)’ bụ Dọkịta Chioma Ezenyimulu n’okwu ya na mmemme ọgbakọ ndị Bishọọpụ, bụ nke weere ọnọdụ n’Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti ahụ.   Ọ kọwara na akụkọ ọjọọ ahụ ndị mmadụ na-akọ banyere ọgwụ ahụ bụ asịrị enweghị isi na ọdụ, ma mee ka a mara na a gbaala mmadụ ruru puku ise ọgwụ ahụ n’ime steeti ahụ ọgwụ ahụ, n’enweghị mpụtara ọjọọ ọbụla si na ya.   Ọ gara n’ihu gwa ndị mmadụ ka ha kwụsị ịtụ ụjọ banyere ịgba ya bụ ọgwụ, kọwaa na a rụrụ ya n’ụdị ọ ga-adị mma na mba Africa na n’ahụ ndị bi n’ime ya; ma kwuo na a pụrụ ichekwaba ya bụ ọgwụ n’igwe njụ oyi e tinyere n’agbata 2 digririi wee ruo 8 digirii. O mekwara ka a mara na, n’ihi na ọ bụ akụ

Ọgwụ mgbochi korona nke adigboroja ejula ahịa – NAFDAC

ỤLỌỌRỤ na-ahụ maka erimeri na ọgwụ n’ala anyị The National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC) etieela mkpu dị egwu gbasara otu ọgwụ e ji egbochi ọrịa korona nke adigboroja (fake) si juputa ala anyị.   Dịka anyị maara, ala Nigeria nọ ụbọchị ọnwa Maachị dị n’abalị nke abụọ nabata ‘3.92 million doses’ ọgwụ ahụ si n’aka Oxford/AstraZeneca ma bụrụ nke a maliterela mebe ihe dị na ya.   Onyeisi ụlọọrụ (Director-General) NAFDAC bụ Ọkammụta Mojisola Adeyeye kwuputara nke a site n’ozi si n’aka onyemgbasa ozi ha (Resident Media Consultant) bụ Sayo Akintola. Ọ dọrọ ndị Nigeria aka na ntị ka ha hapụ igo ọgwụ mgbochi ahụ site n’igwe nzikọrịta ozi ọnya nwudede (online), ka ha wee ghara ịdaba n’aka ndị o so chi egbu.   Ya mere, ọ kpọkuru ndị mmadụ ka ha kee nkwụcha banyere ọgwụ mgbochi adịgboroja ndị ahụ, tinyere ọdị ka ọ dị ha ndị ọzọ.   Ọ dọkwara ndị Nigeria aka na ntị ka ha kee ajị n’ume ma gbaa onye ọbụla ga-achọ iji ọgwụ mgbochi korona nke e nyere n’efu site n’aka mba ọz