Singapore ga-amalite ịgba ụmụaka ọgwụ mgbochi korona
SINGAPORE ekpebiela ịmalite gbaba ụmụaka na-agụ akwụkwọ ọgwụ mgbochi korona nsonso a. Ọ bụ na Monde ka onyeisiala mba ahụ Lee Hsien Loong kwuputara nke ahụ, ka ndị ọkacha mara kọwara na korona ndị ọhụrụ na-emetụta ụmụaka karịa. Mba ahụ nọ n’oge gara aga lebaa anya eleghị anya n’azụ n’igbochi ajọ ọrịa ahụ site n’ịmechi ụlọakwụkwọ ka ha chọpụtara site ọgbara ọhụrụ ya, dịka nke a dị na mbụ hụta n’India, kacha emetụta ụmụaka n’ọnụọgụ dị ukwuu. N’okwu ya nke e gosiri n’onyoonyoo tiivii, Onyeisiala Loong kwuputara na ụmụakwụkwụ site n’afọ iri na abụọ gbagoo ga-abụ òtù ọzọ a ga-agba ọgwụ mgbochi. O kwuru sị: “Na nke ikpeazụ ọ bịara, anyị ahụla ọtụtụ ụmụaka ọ na-emetụta, n’ụlọakwụkwọ ma n’ogige ‘tuition’. Ụmụaka ndị ahụ anaghị arịa ọrịa dị egwu mana nne na nna ha nọ na mgbagwoju anya na mwute. Ya mere, anyị ga-eji ohere ezumike Juunu gbaa ụmụakwụkwọ ọgwụ mgbochi.” A gbacha ụmụakwụkwọ ọgwụ mgbochi, ndị ọ dị n’aka ga-agbaba ndị okenye, site n’afọ iri atọ na iteghete wee gbadaa. Long gar