Ọchịchị m ga-aga n'ihu ịkwàlìtè ọdịmma ụmụaka – Soludo
AKA na-achị steeti Anambra, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo ekwuputela ezi nkwadobe ọchịchị ya dị ịga n’ihu na-akwàlite ọdịmma nà ezi ọnọdụ obibindụ na agụmakwụkwọ ụmụafọ steeti ahụ. Gọvanọ Soludo kwupụtàrà nke a na mmemme Ụbọchị Ụmụaka (Children’s Day) nke ahọ 2022 e mere na steeti ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’amaegwuregwu ‘Ekwueme Square’ dị n’Awka, bụ isi obodo steeti Anambra. Dịka ọ gụpụtachra ozi onyeisiala Nigeria bụ Muhammadu Buhari zigààrà ụmụaka Nigeria maka oke ụbọchị ahụ, ya bụ Gọvanọ jupụtakwàzịrị na ọchịchị ya na-agbasi mbọ ike ịhụ na-aga akwụkwọ ụbọchị Mọnde ọbụla, bụ nke ndị ojiegbe na ndị omekoome megoro ka ọ gharazie ịdị etu ọ dị na mbụ, n’ihi iwu ‘Onye apụtakwala iro’ ahụ ha tiri maka ụbọchị Mọnde ọbụla, nke e nweghị ezi uche maọbụ amamihe ọbụla dị na ya. Ọ kọwara na ọ bụ òkè na ọrụ dịịrị gọọmenti ịhụ na e nwere ezi nchekwa ndụ, ọbụladị ma ndụ ụmụaka; ma kwezie nkwà na gọọmenti ya ga-aga n’ihu n’ezi mbọ ahụ ọ na-agba ịhụ na e nweghị ihe ọbụla ga-adọghàchi aka elekere a