Bidonụ n'oge na-asụrụ ụmụaka Igbo
Igwe Pius Ojonile Omachonu (Ataoja nke abụọ n’Olumbanasa dị n’okpuru ọchịchị Anambra West na steeti Anambra, ma bụrụkwa onye ji ọkwa dịka Odeakwụkwọ Zuzugbe (Secretary General) otu jikọtara ndị eze ọdịnala, Anambra State Traditional Rulers Council akpọọla oku ka ndị Igbo bido n’oge na-asụrụ ụmụ ha Igbo ije mee ka asụsụ Igbo dị ọkpụtọrọkpụ. Igwe Omachonu kwuputara nke a ka onye ntaakụkọ anyị CHINWENDU UZOATU kpọtụụrụ ya n’ụlọ ezumeezu ndị eze ọdịnala nke dị n’obi gọọmenti Anambra, ebe ọ nọrọ gbaa ya ajụjụ ọnụ. Otu a ka o siri ga: KEDỤ ihe ị nwere ikwu banyere etu e si akwalite asụsụ na omenal Igbo na gọọmenti Anambra, dịka ọ dị taa? Ikwalite asụsụ Igbo dị mkpa. Ọ dị mma ka e tinye aka na ya ka ọ ka mma. Na nzukọ ndị eze ọdịnala anyị na-asụ Igbo nke gosịrị na anyị na-agba mbọ izi ezi ụzọ. Ebe ọbụla ndị Igbo zukọrọ sị sụba Igbo, ọ kachasị ụmụaka maka na ọ bụrụ na ebidoghị n’oge sụbara ha Igbo, ha agaghị aghọtacha ya. Igbo bụ asụsụ mbụ nwatakịrị bụ onye Igbo kwesịrị ịsụ. N’ụzọ dị otu a