Ọchịchị Obiano akwàdola ahịa karịrị puku iri n'atọ n'Anambra – ASBA
ỌCHỊCHỊ nọ ugbua na steeti Anambra, nke Gọvanọ Willie Obianọnọ n’isi ya àkwàdola ahịa ruru puku iri na atọ, narị asaa na iri ise (13,750)n’ọnụọgụgụ site n’okpuru atụmatụ na ụlọọrụ ‘Anambra Small Business Agency(ASBA)’. Nke a bụ nke e mereka ụwa mara site n’ọnụ onyeisi ụlọọrụ ASBA, bụ Clems Chukwuka n’okwu ya n’ihemmemme ndị nta akụkọ a kpọrọ ‘Meet the Media’, bụ nke weere ọnọdụ n’Awka bụ isiobodo steeti ahụ. Dịka o siri kọwaa, ụlọọrụ ahụ bụ nke e hibere n’ahọ 2014 siten’aka Gọvanọ Willie Obianọ, ma bụrụkwa nke e jiri ijeri naịra abụọ wee malite.Otu ijeri naịra n’ime ego ahụ bụ nke ha mapụtara maka mgbazinye, ebe otu ijerinaịra nke ọzọ bụ nke ha mapụtara maka nguzobe obere ahịa (MSMEs). O mere ka a mara naha eguzobela òtù kọpretiivu dị iche iche, ma nke ndị na-azụ ahịa, ndị na-arụ ọrụaka,ndị ọrụ ugbo, na ndị ntorobịa. Ọ sị na e nyere ndị ntorobịa ahụ ọzụzụ n’ihe dịiche iche, nke gụnyere ọrụ ugbo, ịzụ ọkụkọ, ịzụ azụ, ịrụ akpụkpụ ụkwụ, ịgba iheọkụ, tinyere ọrụaka ndị ọzọ dị iche iche;