Ndị ọba akwụkwọ enweela ọgbakọ omenafọ n’Anambra
A KỌWAALA ọba akwụkwọ dịka ụlọọrụ dị mkpà n’ịkwàlite mmepe obodo, asụsụ Igbo, na mmụta site ọrụ dị icheiche ọ na-arụ, dịka o siri metụta mmụta na mgbasaozi. Ọkammụta Nkechinyere Nwokoye nke ụlọọrụ ‘Centre for Arts, Culture and Humanities’ nke mahadum Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n’Awka, bụ ya kwupụtàrà nke a na nnukwu ọgbakọ omenafọ nke otu jikọtara ndị ọrụ ọba akwụkwọ dị n’ala Nigeria, ngalaba nke steeti Anambra, bụ nke weere ọnọdụ n’ọba akwụkwọ Ọkammụta Kenneth Dike dị n’Ọka (Awka), bụ isi obodo steeti Anambra. Dịka o siri kwuo, ụwa na-emezị ntụgharị ugbua, ebe ihe niile na-agbanwèzịkwa agbanwè, bụ nke mezịrị o jiri dị mkpà ka a na-akwàlite ọba akwụkwọ, iji na-eto eto ma na-enyekwa ihe a chọrọ n’oge ọbụla. Oge ọ na-enye nkuzi ya na mmemme ahụ, Ọkammụta Nwokoye mèrè ka a mara na obodo ọbụla enwéghị ọba akwụkwọ dị̀ kà mmadụ enweghị mkpụrụobi. O kwukwazịrị na ọ dị mkpà ka ndị ọrụ ọba akwụkwọ teta n’ụra ma tinye anya n’ime ihe gafèé ogigè ụlọọrụ ha, site n’imé ihe pụtara ìhè na gburug