Posts

Showing posts with the label ịwa ji

Òtù egwuregwu Keep Fit emeela Ịwa ji, nye ndi mmadụ onyinye nkwanye ugwu

Image
NDỊ òtù Keep Fit Sports Club, Awka bụ ngalaba Capital Sports Club, Awka, nọ na Satọdee, mee emume Ịwaji Ọhụrụ (New Yam Festiva) 2021. Ha ji mmegharị ahụ nke na-eme ka ọbara mmadụ gbagharịa nke ọma (physical fitness) wee malite ya ma were nkwanye ugwu ‘award’ nke ha nyere ụfọdụ ndị otu ha maka mbọ ha, wete ya na njedebe.   Emume ahụ nke e hibere n’afọ 2020 bụ n’ụlọezumezu Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, SportsLightXTRA na Homeland, ka a nọrọ wee mee ya.   Ndị ọnụ ruru n’okwu sị n’ugwu na ndịda wee bịa maka oke mmemme ahụ. Kaptịn nke Keep Fit Sports Club ma bụrụkwa onyeisi (MD/Chief Executive Officer) ANPC, Sir Chuka Nnabuife kọwara na Keep Fit bụ ngalaba Capital Sports Club nke e hibere iji kesaa mmụta banyere mkpa mmadụ imegharị ahụ (exercise) bara. Ụfọdụ ndị e nyere onyinye nkwanye ugwu na mmemme ahụ Nnabuife (nke asaa n’aka ekpe), Onyeadi (nke asaa n’aka nri) na ọtụtụ ndị ọzọ bịara mmemme ahụ   O kwur

Otu Keep Fit Sports Club, Awka emeela ịwa ji nke afọ 2020

… Mee mmadụ anọ ndị ọzọ nkwado omehala I JI gosi mkpa ọ dị ikwalite omenala Igbo, Keep Fit SportsClub bụ otu jikọrọ nwoke na nwaanyị ndị nwere mmasị n’ihe gbasaara mmegharị ahụmaka nkwalite ahụ ike emeela mmemme ịwa ji nke afọ a bụ nke achịkọbara n’ụlọihe mmemme (Event Center) dị n’ogige ụlọọrụ Anambra Newspapers and PrintingCorporation, Awka.   Otu ahụ malitere mmemmeịwa jị a bụ nke ha na-eme kwa afọ site n’ịmegharị ahụ dịka ha si eme ya kwa izụụkaọbụla. N’okwu mmalite ya, onyeisi otu ahụ ma bụrụkwa onyeisi n’ụlọọrụAnambra Newspapers and Printing Corporation bụ Maazị Chuka Nnabuife kọwara otuKeep Fit Sports Club dịka otu na-emesi ihe ike. O kwuru na ya bụ otu na-agbakọbana ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka kwa ụbọchị Satọde, Wenezide nakwa ụbọchịezumike (public holiday) ọbụla, ma rịọ ka onye ọbụla nwere mmasị na ihe gbasaraegwuregwu mmegharị ahụ bịa ma debanye aha ya ma sonyere ha n’otu ahụ. Ọ gakwazịrị na ihụ kọwaa na mmemme iri ji ọhụụ bụ ihe hana-eme kwa afọ ọbụla ma bụrụ nke n