Posts

Showing posts with the label ịkwasa ụmụaka iko n'ike

A tụọla otu onye isi ụka nga maka imetọ ụmụ ejima nwanyị abụọ

Ụlọ ikpe ‘Ikeja Magistrate Court’ a tụkpụọla otu onye isi ụka aha ya bụ Michael Olise, nke ụlọ ụka ‘Anointing Chosen Vessel, Governor’s Road Iketun, Lagos’, n’ụlọ itiri maka imetọ ụmụ ejima nwanyị abụọ. Onye isi ụka ahụ (Olise) gbara afọ iri ise na anọ bụ enyi nna ụmụejima ahụ, ndị dị afọ iri na abụọ. Onye uweojii okwu di n’aka bụ Raphael Dony kwuru na nwoke ahụ kpara aka ala ahụ n’onwa gara aga n’ụlọ nna ụmụaka ahụ nke dị n’Okota, Lagos. Olise metọrọ ejima nke mbụ ka ọnwa Novemba dị n’ụbọchị iri na ise; ma nọrọkwa n’otu onwa Novemba ahụ metọkwuo ejima nke ọzọ site n’itinye aka n’ihe o jiri bụrụ nwanyị. E kwuru na ụmụ ejima ahụ na nne na nna ha bi mana Olise mere arụ ahụ oge nne ha mere njem na mba ofesi, ebe nna ha gara ọlụ. Ka ihe si gbata kwụrụ, Magistrate Osunsanmi anabataghị arịrịo nwoke ahụ. E yigharịrị ikpe ma ọnwa Jenuarị dị n’ubọchị iri abụọ na atọ.

A tụọla otu nwoke nga maka ịkwasa nwa afọ anọ iko n'ike

OTU ụlọikpe nke dị na kasuwan Nama na Jos, isi obodo Steeti Plateau, atụla otu nwata nwoke gbara afọ iri na anọ nga afọ atọ maka ịma nwata nwanyi gbara afọ anọ elu n’ike. Onye ọkaikpe bụ Lawal Suleiman, tụrụ ya bụ nwata nwoke nga n’enyeghị ya ohere ije ego wee gbanahụ ịga nga. Suleiman kwuru na ya bụ ntaramahụhụ ga-abụ ihe ịdọ aka na ntị n’ebe ndị ọzọ ga-achọ irụ ụdị arụrụala ahụ nọ. Ozi e nwetara site n’aka ‘Inspector’ Yakubu Audu gwara ụlọikpe ahụ na nna nwata nwanyị ahụ bu Ezekiel Jatau, nke si n’okpuru ọchịchị Riyom, nke dị na Bauchi kwuru na nwoke ahụ jị ụzọ aghụghọ kpọrọ nwa ya nwanyi baa n’ime ọhịa ebe ọ nọrọ maa ya elu n’ike.