Ndekwuru nde mmadụ na-arịa ịba ọcha n'anya na Nigeria – Dọkịta Okpala
DỊKA ọ bụ ihe doro anya na ọrịa a mààrà aha ya bụ òzùrù ụwa ọnụ, e meela ka a mara na mmadụ karịrị nde iri abụọ nà-arịa ọrịa ịba ọcha n’anya n’ala Nigeria, bụ nke nwa bekee kpọrọ Hepatitis. Ọ bụ kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti Anambra, bụ Dọkịta Vincent Ọkpala kwupùtàrà nke a oge ya na ndị nta akụkọ na-akparịta ụka n’isi ụlọ ya dị n’Awka bànyere mmemme ụbọchị ọrịa ịba ọcha n’anya na mba ụwa nke ahọ 2019. O kwuru na ala Nigeria so n’otu n’ime mba ọrịa ịba ọcha n’anya si agbasàwanye na mba ụwa dị iche-iche, n’ogoogo dịka pasentị iri na ótù nkịe ọrịa ịba ọcha n’anya B na pasenti abụọ na ụma abụọ nke ịba ọcha n’anya CH, bụkwa nke mkpokọta ya pụtara na mmadụ karịrị ndè iri abụọ nà-arịa ya bụ ọrịa n’ala anyị, ma bụrụkwa ndị amaghị banyere ihe egwù dị na ya, nakwa otu o si emetụta wee na-emetụta akụrụ mmadụ. O mekwàzịrị ka a mara na gọọmenti steeti ahụ na-agbasi mbọ ike esepughị aka ma na-ebukwa agha dị egwu ịhụ na e memìlàrà ya bụ ọrịa ma nyekwa ya ọsọ ụkwụ erughị ala na steeti ahụ. N