Posts

Showing posts with the label Ịwa akwa

Ịwa akwa

A BIA n’ala Igbo, ịwa akwa bụ mmemme a na-emere nwoke tozugoro ogo ịlụ nwaanyị. Ịwa akwa bụ nkwado a na-akwado nwoke ọ bụla rugoro afọ iri abụo na iteghete ma ọ bụ afọ iri atọ nke nne na nna ya na-akwadoro ya. Nwoke ahụ ga-anọ n’ụlọ ha ihe dịka ọnwa atọ, ọ gaghị apụta apụta. Ndị be ha ga-agba nnukwu mbọ ịhụ na a na-enye ya ihe ọ ga na- eri wee rue ụbọchị ahụ ọ ga- alụ nwaanyị. N’ime ọnwa atọ ahụ, a ga- akuzikwara ya ọtụtụ aka ọlụ dị iche iche dịka otu esi akpa ute, ite nkwụ, igbu akwụ nakwa ihe ndị ọzọ ọ ga-eji na-enyere ndụ aka ma ọ lụọ nwaanyị ka agụụ hapụ ịnara ya ụmụaka ya. Oge ụfọdụ, nwoke na-awa akwa ma ọ bụ mgbe ọ wachara akwa, ndị mmadụ na-enye ya onyinye dị iche iche dịka ego, akwa, ihe oriri na ihe ndị ọzọ dị iche iche. N’oge mbụ, Obodo dị iche iche na-eme emume iwa akwa dịka ọnọdụ obodo ha si wee dị. O nwere ụfọdụ obodo na-akwado mmemme ịwa akwa n’otu ọnwa, ụfọdụ jikwa ọnwa abụọ ma ọ bụ atọ akwadobe ya. Obodo ụfọdụ na-eme emume iwa akwa ha n’afọ atọ ọbụla. A bịa n’ Ehime dị