Posts

Showing posts with the label Ịre ụmụaka

Ịre ụmụaka: Anambra a dọọla ndị na-elekọta ụmụaka anya aka na ntị

GỌỌMENTỊ Steeti Anambra ekpebiela ịkwusị nsogbu nke ire ụmụaka na-ewete na steeti ahu. N’ihi ya, gọọmentị achọputachaala ma mata ọnụọgụ ụlọ ebe a na-elekọta ụmụaka (daycare centres) na ebe ndị ọzọ nile na-ahụ maka obere ụmụaka na steeti ahụ iji kwụsị ya bụ nsogbu. Onye mere ka nke a pụta ihe bụ kọmishona na-ahụ maka odi mma na ihe metụtara ụmụnwanyi na ụmụaka ‘Commissioner for Social Welfare, Women and Children’ Lady Ndidi Mezue. Ọ kọwara nke a ka a nọ n’ihe ọmụmụ (workshop) nke a chịkọbara maka ndị niile nwere ebe a na-elekọta ụmụaka na steeti ahụ na Wenezdee n’Awka. Onye kọmishọna ahụ nke onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ Willie Obiano n’ihe gbasara ngalaba ahụ, bụ Hon. Onyeka Ebenebe kwuru sị na ọdịghị gọọmentị obi mma ihe ọjọọ dị iche iche nke a na-ahụta n’ufọdụ ebe a na-elekọta ụmụaka. Kọmishọna ahụ kọwara na goomenti gbarụrụ ihu otu ụdị ajọ ihe ahụ si ebutere steeti Anambra aha ojọọ ma a gbasa ya n’ikuku, ọ kachasi mgbe ọ gbasara ire ụmụaka e ku n’aka. Ọ gara n’ihu kwuo na ọtụtụ