Posts

Showing posts with the label Ịmụ ejima

Ịmụ ejima n'ala Igbo

EJIMA bụ onyinye si n’aka Chineke. Ihe ọ pụtara bụ nwaanyị ịmụ karịa otu nwa n’otu oge.   N’oge gboo, ndị Igbo na-ahụta ejima dịka ihe ala na-asọ asọ. N’oge ahụ a na-egbu ụmụejima ma a mụọ ha. Ha mere ihe ndị ahụ n’ihi na ha aghọtaghị. Ha si ụzọ dị otu ahụ gbufuo ọtụtụ ụmụaka bịara ụwa aka ha dị ọcha. Ọtụtụ ụmụnwaanyị ka ha gbabara aka nwa; ebe ọtụtụ nwetara obi mgbawa n’ihi ọnwụ ụmụ ha. N’oge ụfọdụ, ụmụnwaanyị na-agabiga ntaramahụhụ dị egwu ma ha mụchaa ejima.   Otu o sila dị, n’ihi ọbịbịa ndị ọcha e wetara igbu ejima n’isi njedebe. Ma ka nke ahụ gachara ndị ọgọ mmụọ anabataghị ya nke mere na ha bidoro kpagbube ụmụnwaanyị egbughị ejima ha site n’ịmachi ndị mmadụ imekọnyere ha; ịmachibido ha n’ihe obodo na-eme. Ha bata ebe e nwere ọgbakọ ọtụtụ ndị mmadụ agaghị atụpụrụ ha ọnụ, o kwe ihe ọnụ n’ahịa agaghị eresi ya. Ma n’ime ihe niile, nke ahụ mechara bụrụ akụkọ mgbe ochie.   N’ụwa taa, ejima bụ ihe oke ọńụ. Ezinaụlọ ọbụla ejima batara be ha na-ekele Chineke n’ebe ọ dị ukwuu ma kpọọ oriri

Ịmụ ejima n'ala Igbo

 EJIMA bụ onyinye si n’aka Chineke. Ihe ọ pụtara bụ nwaanyị ịmụ karịa otu nwa n’otu oge.   N’oge gboo, ndị Igbo na-ahụta ejima dịka ihe ala na-asọ asọ. N’oge ahụ a na-egbu ụmụejima ma a mụọ ha. Ha mere ihe ndị ahụ n’ihi na ha aghọtaghị. Ha si ụzọ dị otu ahụ gbufuo ọtụtụ ụmụaka bịara ụwa aka ha dị ọcha. Ọtụtụ ụmụnwaanyị ka ha gbabara aka nwa; ebe ọtụtụ nwetara obi mgbawa n’ihi ọnwụ ụmụ ha. N’oge ụfọdụ, ụmụnwaanyị na-agabiga ntaramahụhụ dị egwu ma ha mụchaa ejima.   Otu o sila dị, n’ihi ọbịbịa ndị ọcha e wetara igbu ejima n’isi njedebe. Ma ka nke ahụ gachara ndị ọgọ mmụọ anabataghị ya nke mere na ha bidoro kpagbube ụmụnwaanyị egbughị ejima ha site n’ịmachi ndị mmadụ imekọnyere ha; ịmachibido ha n’ihe obodo na-eme. Ha bata ebe e nwere ọgbakọ ọtụtụ ndị mmadụ agaghị atụpụrụ ha ọnụ, o kwe ihe ọnụ n’ahịa agaghị eresi ya. Ma n’ime ihe niile, nke ahụ mechara bụrụ akụkọ mgbe ochie.   N’ụwa taa, ejima bụ ihe oke ọńụ. Ezinaụlọ ọbụla ejima batara be ha na-ekele Chineke n’ebe ọ dị ukwuu ma kpọọ orir