Posts

Showing posts with the label Ịkwa ozu

Ịkwa ozu n'ala Igbo, oge gboo na oge ugbu a

NA mgbe gboo, ịkwaozu dị nfe n’ala Igbo. Mmadụ nwụọ ndị ezinaụlọ ya na eme mmemme akwamaozu ya oke aka ha ra. Oge ụfọdụ, onye nwụrụ enweghị ihe o debere, ụmụ ya enweghị ihe ha nwere, e gwuo ala lie ya ozigbo, ụmụnna agbaa izu mekọlata akwamozu ya makana onye ọzọ nwụọ, agaghị eme mmemme ọbụla.   N’ezie, Igbo na-asụ n’olu n’olu ma ha kwaa ụkwara ọbụrụ ofu. Igbo kwenyere na onye nwụọ, ọ bụrụ na akwaghị ya, onye ọzọ nwụọ agaghị akwa onye nke abụọ nwụrụnụ.   Ọ bụ ezie  na ihe e ji akwa ozu dị ukwu ma na ọbụ ka ndị si chọ ịkwa ozu ka ha ga- eji kwaa ozu ha maka Igbo kwuru sị na ọ bụ ka aka ha nwaanyị ka ọ na-atụkwasa di ya.   Ụfọdụ obodo na steeti Anambra emeela ya ka ọ dị mfe site n’ibelata abalị olemole ha ga akwa ozu. Ụfọdụ mechiri isi nri. Ọ bụrụ na mmadụ kpatara ego, chọọ ịkwa nne, nna maọbụ nwanne ya, nke ahụ dị iche mana o kwesịrị ịbụ mgbe nne, nna na nwanne ya ahụ dizuru ụbọchị ndụ nke bụ nke ndị Igbo na-akpọ ozu oriri.   Ọka mma mmadụ nwụọ, ụmụ ya na ụmụnne ya ghara ime dịka onye nk