Nri ndị Igbo: Ịgbaọka e ji akụ mkpu sie
Ọ DỊ ụfọdụ nri ndị Igbo a na-echezọ n’oge ugbu a, ọ kachasi ndị bi n’obodo mepere emepe. Ụfọdụ ga-asi gịnị bụ ịgbaọka? Ịgbaọka bụ otu n’ime ihe oriri ndị gboo ji zụọ ụmụ ha, ebe ụfọdụ ga-asị na ọ bụ nri ndị ogbenye. N’ezie , ịgbaọka bụ ihe oriri dị mma mana ndị nne na nna na-eleda ya anya. Ka anyị baa n’ịma ka e si akwado ịgbaọka e tinyere akụ nke ụfọdụ na-akpọ ọsụ akụ, ịgbagwu ọka, ụkpọ ọka, ya na ka e si esi ya. Mbụ, I weta ogbe ọka, ị gbachaa mkpụrụ ọka, ọ bụrụ ọka ka dị mmiri, ị saa ya wụnye n’ihe ị ga-eji kwọọ ya, tinye ya ose ndụ na yabaasi buga ya n’igwe na-akwọ ọka. Ị bata, ịgbanye ya mmanụ, nnu, ịra, ose na akụmkpu ị mechara nke ọma, sachaa ya ka aja ghara ịdị ya, ị chọọ ị tinye ya nchụanwụ I bere kịrịkịrị, I were osisi maọbụ ngaji gwọkọba ya ruo mgbe ihe niile ahụ ị tinyere ga-agwọkata ọnụ nke ọma. Ị gbanye ya mmiri dị ńarańara. Cheta na mmiri agaghị akarị ka I nwee ike ikechi ya n’akwụkwọ unere maọbụ akwụkwọ ojoko. I kechie ya, ị gbanye mmiri sinye n’ọkụ, ọ gbọọ, were