Ịgba alụkwaghị m di na nwunye
ỊGBA alukwaghịm bụ ihe na-adapụta na ndụ. N’ebe di na nwunye nọ, nwoke nwere ike ịgba nwanyị alụkwaghị m, nwanyị nwekwara ike ịgba nwoke alụkwaghị m. A na-eme nke a ma ọ bụrụ na ọ kwekaghị di na nwunye omume. N’oge mbụ, o nwere usoro e si eme ya, nke a mere na ọ bụghị ihe na adapụta mgbe ọbụna. Mana n’oge ugbua, ịgba alụkwaghị m di na nwunye tọpụrụ ogọdọ gbara ọtọ. Nke bụzi ma n’ụzọ omenala Igbo, ma n’ụlọ ụka, tinyekwara ụlọ ikpe, alụkwaghị m na-arị ibe ya elu. Ihe na-ewuzi n’ọhịa na ụzọ bụ a lụọ taa, a gbasaa echi. Otu onye ụkọchukwu, mgbe ọ na-akụzi nkuzi nke okwukwe n’ụlọụka kwuru na ihe na-akpata mgbasa di na nwunye bụ elerughị anya tupu abanye n’alụm di. O kwuru na ọ na-adị ndị mmadụ ọsọ ọsọ ịbanye n’alum di ebe ha amaghị na ọbụghị ihe e ji ọsọ abanye. O nyere ọmụmaatụ otu nwokorobia si chọọ ịlụ nwanyị, ka ọ gwachara onye ahụ na ọ chọrọ ịlụ ya, ọ hụkwa nwanne nwanyị ahụ nke obere, hapụzịa onye nke mbụ, lụbazịa nke obere ahụ. Ọ karịghị otu afọ, ha gbasaa, o fochaa ha n’anya. Ọ dụk