Posts

Showing posts with the label Ịgba Áfá

Ịgba Áfá

NDỊ Igbo nwere ọtụtụ nkwenye dị iche iche, bụ ihe hajidesiri aka ike, ma bụrụkwa nke sitere n’aka ndị nna nna anyị wee rute anyaaka. Nkwenye ndị a abụghị naanị na ha sitere n’aka nna nna anyị ha wee rute anyịaka, kama, ha na-apụtakwa ìhè ma na-emezùpụtakwa emezupụta dịka a tụrụ anya.   Ndị Igbo, ọkachasịna mgbe gboo, nwere otu usoro pụtakarịchara ìhè ha si achọpụta ihe mere eme,ihe na-eme eme, ihe ga-eme eme, na ihe bụ eziokwu, ya na ụzọ ha si achọpụta maọbụna-ahụ ihe nzuzo ọbụla mmadụ dị ndụ apụghị ịchọpụta maọbụ hụ site n’anya nikịtịdịka mmadụ nkịtị. Otu usoro ahụ bụ ịgba afa, maọbụ ịjụ èsè (àsè), dịka ndị siakpọ ya.   Ọ bụ usoro ndị mmadụsi achọpụta echiche ndị mmụọ ma na-ajụpụtakwa ndị mmụọ ihe ụfọdụ dị omimi. Ọ bụonye dị ndụ na-agba afa, mana ọ bụghị onye ọbụla dị ndụ na-agba afa, maka na ekere ọrụ eke. Ya bụ na ọ bụghị onye ọbụla chọrọ ịgba afa ga-agbanwu afa, makana mmanwụ ọbụla mà obom ruru ya. Ịgba afa dịịrị dibịa, mana ọ bụghịkwa dibịaniile nwèrè ike ịgba afa, maka na ihe ụwa