N'Anambra, Nri emeela emume Ịgụ Arọ
OMENALA bụ nnọọ njirimara ndị ma bụrụkwa ebube e ji ama mbà n’ọha obodo. Nke a bụ nke pụtara ihè n’anya ụwa na nsonso a dịka imirikiti mmadụ zukọrọ n’óké obi ndị Igbo, bụ obodo Nrị nke dị n’okpuruọchịchị ime obodo Anaọcha nke steeti Anambra wee merube mmemme Ịgụ Arọ Ndị Igbo, bụ nke malitere kemgbe ọtụtụ ahọ gara aga. Ya bụ emume Ịgụ Arọ, nke ọtụtụ ndị mmadụ sitere ebe dị iche iche sonyere na ya, bụ àgbà nke otu puku na iri abụọ na atọ (1023) ya, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n’obi Eze Tabansi Udene, bụ onye nọ n’isi nlekọta ihe ọkpụ Iri. N’okwu ya n’ebe ahụ oge ọ na-eme omenala Ịgụ Arọ ahụ kpọnkwem, onyeisioche Umuọkpala Adama, Dọkịta Emma Enemuo kọwàrà ya bụ mmemme dịka oke mmemme pụrụ iche n’ala Igbo, ya na mmemme a na-anọ na ya wee kwuwaa mmalite oge ọrụ ugbo n’ala Igbo, kwuo ka ọrụ ugbo ga-esi gaa, ma kpee ekpere, gọkwa ọfọ dị icheiche maka oge ọrụ ugbo ahụ, ya na udo na ọganihu obodo Nri na ala Igbo niile. O nyere nkọwa banyere emume Ịgụ Arọ n’ala Igbo, kọwaa uru ọ bara, mpụta