Ịchafu na uru ọ bara
ỊCHAFỤ so n’otu ihe ụmụnwaanyị ji eji ejiji. E ji ya ekechi isi n’ụzọ dị iche iche. Ụmụnwaanyị niile, site na nwata ruo n’okenye na-asụ ịchafụ. Omenala ụfọdụ kwadoro na nwaanyị ga na-asuchi isi ya dịka okpukperechi dị iche iche sikwa kwu. Ya mere, n’ọtụtụ agbụrụ ọ bụ iwu na nwaanyị ọbụla, ọ kachasị ndị nọ na dị ga na-asuchi isi ha oge niile, ebe ụfọdụ debere ya na ọ bụ so mgbe ha nọ n’ime ụlọụka maọbụ mgbe ha na-ekpe ekpere ka ha ga na-asuchi isi. N’ebe ndị dị otu ahụ nọ, nwaanyị asụchighị isi ya dara iwu. Otu o sila dị, n’oge ugbu a ma n’oge ochie e ji ịchafụ eke ekike. Ọmụmaatụ, n’ala Igbo, mgbe ọbụla nwaanyị ma ukwu akwa abụọ ọ na-eji ịchafụ kwesịrị akwa ahụ suchie isi ya, o wee dabaa nke ma. Onye ma akwa jọọji na-eji nnukwu ịchafụ ụdị ọ na-abụ a sụcha ọ dị ka a rụrụ ụlọ n’isi mmadụ, wee sụchie isi ya nke bụ na ị hụ ya ị mara na ọ na-aga nnukwu mmemme. Otu o sila dị, a na-ejikwa ịchafụ eme ngala n’oge a. Ụfọdụ na-ekonye ya n’olu, ebe ụfọdụ na-ekedo ya n’agba tinyere ụzọ ndị