Posts

Showing posts with the label Ịchị ọchị

Ịchị ọchị dị mkpa na ndụ mmadụ

A KỌWAANA ịchị ọchị dịka otu ụzọ mmadụ ga-esi bie ogologo ndụ n’ụwa a. Ịchị ọchị na-egosi obi ańụri. Ọ na-egosipụta n’eziokwu na obi mmadụ dị ọcha. Ọ bụ nke a so n’ihe mere mba ụwa ji wepụta ụbọchị ụka, ọnwa a ga-adị na mkpụrụ ụbọchị isii dịka ụbọchị ịchị ọchị ‘World Laughter Day’.   Nke a bụ iji gosi ndị mmadụ na ịchị ọchị bara nnukwu uru na ndụ mmadụ. Ịchị ọchị na-egosi ihu ọma, nke a mere na onye ọ bụna na-achị ọchị na-enweta amara n’aka ndị mmadụ. Ọ bụrụ na mmadụ chọọ inweta ihe n’aka mmadụ, ọ bụ ọchị ka ọ ga-ebu ụzọ chịara onye ahụ makana mmadụ dobe ihu ka onye ewu ya mụrụ mkpi mkpi, ọ gaghi enweta ihe o kwesiri inweta.   Onye ọ bụna na-achị ọchị bụ onye ndị mmadụ na-ahụ n’anya. A bịa n’ebe ụmụaka nọ, ha na-eji ya enweta onyinye n’aka okenye. Nwa e ku n’aka na-achị ọchị, ndị mmadụ na-ahụ ya n’anya ma na-ekughari ya makana ha na-ahụta ya dịka nwatakiri na-enwe obi ụtọ. Onye ọ bụna na-achị ọchị a naghị enwe mgbakasị ahụ makana ọchị na-achụpụ iwe na ọnụma.   Ịchị ọchị na-achụpụ ọrịa