Posts

Showing posts with the label Ị gọ ọfọ

Ị gọ ọfọ ụtụtụ na Ọdịnanị

N’IME Ọdịnanị Igbo, anyi nwere usoro onye odinani si agọ mmụọ. Chetakwa na ịgọ mmụọ bụ ị kpọku mmụọ di Icheiche dịka Chukwu okike, Ani, Chi na Ndịmbụ na Ndịegede. Mgbe ọbụla mmadụ kpọkuru mmụọ, onye ahụ a gọọla mmụọ. ikwọ aka ụtụtụ Nwoke Ọdịnanị teta ụra na ụtụtụ, o buru ụzọ kwụọ aka ya, sachaa ihu ya, ma saa ọnụ tupu ọ malite ị gọ mmụọ. Mgbe ọ na akwọ aka ụtụtụ, ọ ga na e kwubi okwu n’isi ezi n’ụlọ ya, Ọ ga adị na-ekwu sị , na ya na-akwọchapụ ihe ọjọọ nine mere n’ime abanị mgbe ya nọ n’ụra, Ihe ọjọọ dịka, ụchụ na ọgbanukè. Ọ kwọchaa aka ụtụtụ, o buru oche ya nọdụ-ana, were kpọkuo mmụọ na emere ya ihe ka ha bia gere ihe ọ chọrọ i kwu. Ịgọ mmụọ Mgbe ọ na akpọku mmụọ ndị ahụ, ọ ga e jiriri ihe n’aka, maka na anaghị agba aka akpọ mmụọ ihu. Ọ ga e ji otu n’ime ihe ndịa: ọjị, edò, mmanya, nzu, ose, maobụ mmiri. Ọbụrụ na ọ ọjị ka o ji, o buru ụzọ kpọọ Chukwu kere ụwa, kpọọ Chi ya, kpọọ Ndimbụ na ndị egede, sị ha bịa taa ọjị. Ọ ga a kpọ Eke, Orie, Afọ, Nkwọ sị ha bịa soro taa ọjị. Cheta na mg