Òtù Ogazị ebunyela ogige ụmụaka dị na Nise ihe nkwalite ọnọdụ obibi ndụ
OKE ọñụ dàrà nnọọ na nso nso a n’ogige ụmụaka enweghị nne nanna a maara dịka ‘Blessed-Nise Community Children’s Home’ dị na Nise, n’okpuru ọchịchịime obodo Awka South nke steeti Anambra, dịka òtù nnọọrọ onwe a kpọrọ ‘OgaziFoundationa’ jiri ọtụtụ ihe dị iche iche wee wee ga leta ya bụ ògìgè. Ihe ndị òtù ahụ bùrù wee gaa ebe ahụ gụnyèrè ihe erimeri,ihe dị iche iche e ji akwalite ọnọdụ obibi ndụ, nakwa ihe ndị ọzọ mmadụ pụrụiji chekwaba onwe ya pụọ n’ibute ọrịa nje ‘coronavirus’. N’okwu ya oge ọ na-enyefè ihe ndị ahụ n’aka ndị nlekọtaogige ahụ, onye guzobere, ma bụrụkwa onyeisi òtù ahụ, bụ Dọkịta Chidi Okoye, kọwarana ebumnobi nke ahụ bụ iji tụnye ụtụ nke ha n’ime ka ihu ọchị waa ndị nọ na yabụ ogige n’oge mmemme Isita a, ọkachasị ugbua ọrịa nje ‘coronavirus’ na-emezịmkpamkpa ma na-emetụtakwa ọtụtụ ndị mmadụ n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche. Nwa amadi ahụ, nke ọ bụ otu onye n’ime ndị isi nlekọta òtùahụ, bụ Maazị Marcel Manafa gụpụtàrà ozi ya, gàrà n’ihu kelee ndị nlekọta ahụmaka etu ha si elekọta