Òtù 'All4One' akwụọrọla mmadụ 14 ụgwọ ụlọọgwụ na Nnewi
ÒTÙ ọrụ obi ebere a maara dịka ‘All4One Friends Club of Nigeria’ nọrọ na nsonso a wee kwụọrọ mmadụ iri na anọ ụgwọ ụlọọgwụ n’ụlọ ahụike nkụzi Mahadum Nnamdị Azikiwe dị na Nnewi, n’okpuru ọchịchị ‘Nnewi North’ nke steeti Anambra. Ya bụ òtù, nke ebumnobi ya bụ ịkwalite ọdịmma ndị òtù ya, ịkwalite mmụọ ịdị n’ótù n’etiti ndị òtù ahụ nakwa òtù ndị ọzọ, na inyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka, kwụụrụ ndị ahụ ụgwọ ụlọọgwụ ahụ dịka ótù n’ime ụzọ ndị ọzọ pụrụ iche ha siri chịkọta ahọ gara aga bụ ahọ 2020, wee nabatakwa ahọ ọhụụ, bụ ahọ 2021. N’okwu ya oge ha gara ịkwụ ya bụ ụgwọ ụlọọgwụ, onyeisi ndị òtù ahụ, bụ Maazị Ifeanyi Epundu kọwara ụgwọ ahụ ha kwụụrụ ndị ahụ ahụ adịghị dịka otu n’ime ụzọ dị iche iche ha si enyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka, ọkachasị ndị ọrịa nọ n’ụlọọgwụ na ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Dịka ọ na-ekwu na nke ahụ ga-enye aka ime ka ihu ọchị waa ndị ahụ soro rite úrù na ya n’ime ahọ ọhụụ a, Maazị Epundu gara n’ihu gwa ndị ahụ nakwa ndị ọzọ nọ n’ọnọdụ mkpa maọbụ ihe isi