N'Anambra, NSCDC na Red Cross ejikerela ịkwàlitè mgbataọsọ n'oge ihe mberede
ỤLỌỌRỤ nchekwa ‘Nigeria Security and Civil Defence Corps’ a maara dịka NSCDC n’aha mkpìrìsì (ngalaba nke steeti Anambra) ekwela nkwà ijikọ aka ọnụ, ya na ụlọọrụ ‘Red Cross Society of Nigeria’ iji kwàlite mgbataọsọ enyemaka n’ebe e nwere ọgbaaghara, ihe mberede maọbụ ụdị ọnọdụ ntụmadị ndị ọzọ. Dịka ozi a kụpụrụ site n’aka onye na-ahụ maka mgbasaozi nà mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ NSCDC n’ime steeti Anambra, bụ DSC Okadigbo Edwin siri kọwaa, ọ bụ onyeisi ụlọọrụ NSCDC na steeti ahụ, bụ Maazị Everestus C. Obiyo, JP+, kwupụtàrà nke a oge ndị sitere ụlọọrụ ‘Red Cross Society of Nigeria’ (ngalaba steeti Anambra), gara kpọtụrụ ya n’isi ụlọọrụ ya dị n’Awka, bụ isi obodo steeti Anambra ụbọchị Wenezdee. O chètààrà ha mkpà ọ dị ka ụlọọrụ abụọ ahụ nwee ezi mmekọrịta na njikọaka n’ọrụ, ọkachasị dịka o siri metụta ịgbaje ọsọ enyemaka, ịzọpụta ụmụ mmadụ na iwètà udo n’ebe ọbụla ọgbaaghara maọbụ ihe mberede na ọnọdụ ntụmadị dapụtara n’ime steeti ahụ, n’ihi ọrụ dịịrị ha n’ebe e nwere ụdị ọnọdụ dị etu