Posts

Showing posts with the label 'International Festival of Engineering Science and Technology'

Ụmụakwụkwọ Anambra eritela ọla nchara n'asọmpi nkà na ụzụ mba ụwa

ỤMỤAKWỤKWỌ sitere ụlọakwụkwọ ‘St John’s Science and Technical College’ dị n’Alor n’okpuru ọchịchị Idemili South nke steeti Anambra eritela ọlà nchara n’asọmpi mba ụwa a kpọrọ ‘International Festival of Engineering, Science and Technology’, bụ nke weere ọnọdụ na Monastir nke mba Tunisia. Asọmpi ahụ bụ nke were mkpụrụ ụbọchị iteghete, màlite n’abalị iri abụọ na otù nke ọnwa Maachị wee ruo n’abalị iri na itoolu, ma bụrụkwa nke ọ bụ ụmụakwụkwọ nọ n’agbata ahọ iri na anọ wee ruo n’agbata ahọ iri abụọ na otu sonyere na ya, bụ ndị sitere mba iri anọ sònyere na ya. Ụmụakwụkwọ Anambra ahụ gara ya bụ asọmpi bụ maazị Meshack Ugwuishi, maazị Onyedika Chuka-Umeora, maazị Chukwualụka Nwachukwu, na maazị Dominic Machi, ma bụrụkwa ndị nwetara mmeri site n’ihe ha jiri aka ha rụọ, bụ nke ha kpọrọ ‘Adaptable Alternative Power Supply for Sub-Saharan Africa’. Ya bụ akụrụngwa bụ igwe na-ewèta ọkụ, site n’igwè solar bụ nke na-enyere ya aka ịdọta ike sitere n’anyanwụ, jìgide ike ahụ wee na-ekesà ya dịka ọkụ n