Mmanwụ awakpola ndị ụka n’Uke
Uchenwa Mba IHE dịka otu onye ka a na-akọwa na o tufuru ndụ ya ebe ihe karịrị iri mmadụ abụọ na abụọ merụrụ ahụ na Fraidee, ọnwa April dị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ, mgbe igwe ndị mmọnwụ wakporo ụlọ ekpere ‘Holy Ghost Adoration Ministry’, Uke na Steeti Anambra. Ndị mmọnwụ a ka a na-akọwa na ha nubatara ma tibe ndị bịara ekpere ihe ma chọkwa iburu onye isi ‘adoration’ a bụ ‘Rev. Fr’. Emmanuel Obimma (Ebube Mụọnsọ). Ndị isi ụlọ ụka a kpọkury ndị ‘Speicla Anti-Robbery Squad’ (SARS) ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka. Ndị SARS nwuchikọrọ ndị mmọnwụ atọ; nke mere ka ndị otu mmọnwụ gbawa mbọ igbochi ha. Ọ bụ nke a mere ndị SARS ji gbalie egbe elu nke mere ka ha buru ndị mmọnwụ ahụ pụọ. Onye bụ ‘Police Public Relations Officer’ (PPRO) na Steeti Anambra bụ ASP Nkiru Nwode kwetere na akụkọ a bụ eziokwu. Ọ kọwara na ọ dighi mgbe ndị otu mmọnwụ ji lụso ndị SARS ọgụ. O kwuru na a nwụchikọrọ ndị mmọnwụ atọ; mana ka ọ dị ugbu a, ha na-aga n’ihu inyocha ihe kpatara ya bụ ihe jiri mee.