Nwata nwaanyị akpọchiri n'oge ngagharịiwe #EndSARS amụọla nwa n'ụlọnga
A TỌHAPỤLA nwa na-eto eto, Kemisola Ogunniyi ka ọ mụchara nwa n’ụlọnga. E mere nke ahụ site n’Ulọikpe Ukwu steeti Ondo dị n’Olokuta, ebe onye ọkaikpe Justice Omolara Adejumo nyere iwu na ọ ga-akpọta onye akaebe n’ọnụego dị nde naịra iri (N10 million). Ka anyị cheta na okwupuru onye ọ dịịrị (lawyer), Tope Tomekun kpọrọ oku n’oge gara aga ka a tọhapụ Kemisola Ogunniyi, onye a nwụchịkọrọ n’oge ngaghari #EndSARS na steeti Ondo, bụ onye nke mụrụla nwa n’ụlọnga. Temokun, n’edemede leta nke o degaara Kọmishọna na-ahụ maka ikpemkwumọtọ (Commissioner of Justice and Attorney-General), ‘Sir’ Titiloye Charles, kwuru na a nwụchikọrọ Kemisola na mmadụ atọ ndị ọzọ n’oge ahụ. O kwuru na ndị ọzọ a nwụchịkọrọ ma kpọchie n’ụlọnga kemgbe Oktoba 24, gụnyere Ayodele Bukunmi, Ojo Samuel na Ani Obinna, ma kọwaa na mmadụ anọ ndị ahụ nọ n’ụlọnga Surulere dị n’okpuru ọchịchị Ondo West kemgbe Oktoba, afọ gara aga. Dịka Temokun si kwu, ebubo e boro ha gụnyere izu ohi, imebi ihe w.d.g. O kwuputara na aka K