Mkpụrụosisi e tinyere kabaịdị nwere ike ibute ọrịa kansa, mebie akụrụ – NAFDAC
Chinwendu Uzoatu dere akụkọ ndị a
ONYEISI Zuzugbe ụlọọrụ na-ahụ maka erimeri na ọgwụ n'ala anyị, National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC), Ọkammụta Mojisola Adeyeye ekwuola na mmadụ iri mkpụrụosisi e tinyere kabaịdị 'calcium carbide' nwere ike ibute ọrịa kansa, obi, akụrụ na imeju.
Ọkammụta Adeyeye gara n'ihu kwuo na mkpụrụosisi e tinyere ajọ ihe ahụ nwekwara ike ime mmadụ oke agụụ mmiri ọṅụṅụ, ọnụ na imi mgbakasị (irritation), ike ọgwụgwụ, mbibi anụ ahụ ga- adị ọkpụtọrọkpụ, inwe nsogbu n'ilo ihe, ịgbọ agbọ na ọnya anụ ahụ.
Adayeye mere ka ndị ntaakụkọ mata banyere nke a ma kọwaa na ọnọdụ ahụ bụ ihe cheere ọhaneze aka mgba. O kwuru na ụlọọrụ ahụ kere ajị n'ume ịgba ya bụ ụzọ owere mgba.
Ọ kọwara na mkpụrụosisi na- enye ezigbo ihe n'ahụ ma na- egbochi ọrịa, tinyere ihe ndị ọzọ.
Ọ rụtụrụ aka na mkpụrụosisi ịcha acha dị mma n'ihi na ọ bụ ka o kwesịrị ịdị, nke na-eme ka e nwee ike iri ya eri, ma dịkwa nro, tọọ ụtọ wdg.
Otu o sila dị, ịta mkpụrụosisi dịka mango, unere, ojoko, gova, oroma wdg e tinyere kabaịdị dị njọ n'ahụike mmadụ.
Okwuru: "Mkpuruosisi e tinyere kabaidi nwere ike chaa n'elu ahụ ma ọ gaghị acha n'ime. Ị ga-achọpụta ha site n'ịhụ mkpụrụosisi chara tọọ ma isi ya 'stem' na- eji oji, ọ kachasị n'unere na ojoko."
Ọ gara n'ihu rụtụ aka ụdịdị mkpụrụosisi chaara onwe ya si adị, dịka inwe ntụpọ oji oji n'ahụ ya ebe ndị e mere ka ha chaa n'ike na-enwe ihe na- acha ntụ ntụ n'ahụ ma na- ewocha ọsọ.”
Comments
Post a Comment