CAN akatọọla mwakpo a wakporo ndị ụka RCCG n'Ogun
Chinwendu Uzoatu dere akụkọ ndị a
ÒTÙ Christian Association of Nigeria (CAN) akatọọla mwakpo nke a wakporo ndị ụka Redeemed Christian Church of God (RCCG) n'Abule-Ori nke dị n'okpuru ọchịchị Obafemi Owode na steeti Ogun.
CAN n'ozi ya kasiri òtù ụka ahụ obi banyere ogbugbu e gburu pastọ ha, tinyere ndị a tọọrọ atọrọ ndị nke o kwuru na ha nọọrọ onwe ha na-ekpere chi ha dịka onye ọbụla nwere ohere ime.
Onyeisioche CAN, Achịbishọp Daniel Okoh, n'ozi ahụ toro ndị ọrụ nchekwa maka oke mbọ ha gbara ma kpọọ oku ka a hụ na a nwụchịkọrọ ndị kpara arụ ahụ.
Ọ gara n'ihu kasikwaa ndị ụka RCCG tinyere ndị Salvation Army obi, banyere ihe mberede okporoụzọ mere nsonso a, bụ nke pastọ iri na abụọ, otu nwa e ku n'aka na ọkwọụgbọala tufuru ndụ ha n'okirikiri Benin City nke steeti Edo. Achịbishọp Okoh kwuru na ya bụ ọnọdụ ọjọọ nke butere ọnwụ ụmụodibo Chineke wutere ndị ndu CAN.
O kwuru: “Nke a bụ nnukwu ihe otiti n'ebe ndị ụka Christ nọ na Nigeria, tinyere ndị ala anyị niile n'Oyo. Anyị kwudoro ndị Salvation Army n'ekpere n'oge oke ihe mgbu a, na-arịọ ka Chineke kasie ha obi ma belata ihe mgbu ha. Anyị na-akpọku gọọmenti ka ha nyochaa ihe mberede ahụ, iji gbochie ụdị ya imekwa ọzọ.”
CAN kpọkuru ndị ọrụ nchekwa dị iche iche ka ha tinyewanye anya n'ebe a na-ekpe ekpere n'ọgbakọ ndị ụka iji weta ezi nchekwa.
O kpere ekpere otu a: “Ka ndị mmadụ ghara inwe obi ịjụ oyi n'ihi ihe ndị a merenụ, ka ha gaa n'ihu na-elegide Chineke anya maka enyemaka. Uche anyị na ekpere anyị na-agara ezinaụlọ na ụka o metutara.”
Comments
Post a Comment