Posts

Showing posts from June, 2023

Soludo ehibela afọ ọrụ ugbo 2023 n'Anambra, kwe nkwa imela ụbịam

Image
  Izunna Okafor dere akuko a ỌCHỊỌRA steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo nọrọ  na nsonso a wee gbapee amụma afọ ọrụ ugbo nke afọ 2023 na steeti ahụ, ma kwe nkwa ime ka ndị Anambra nwee ihe oriri gbaanyụụ.   Mmemme ịgbape afọ ọrụ ugbo ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'Amaegwuregwu Alex Ekwueme dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ndịisi ọchịchị steeti ahụ, ndị omeiwu steeti Anambra, na ọtụtụ ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ.   Ka ọ na-agbape ya bụ ahọ ọrụ, Gọvanọ Soludo kwupụtanworo ọzọ na ọchịchị ya dị ezi njikere itute na ịkwalitekwa atụmatụ ịkụ osisi dị icheiche na-enye ego na steeti ahụ, dịka akị oyibo, akwụ na osisi ndị ọzọ, bụ nke nyere mpaghara ala Igbo ọtụtụ ego n'oge nke Michael Okpara lagoro mmụọ, bụ onye jibụrụ ọkwa dịka Gọvanọ mpaghara ọwụwa-anyanwụ ala Nigeria.   Soludo, nke onye nọchitere anya ya n'ebe ahụ bụ Osote ya, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim, kwùrù na ọ bụ n'ihi ebumnobi ahụ ka ọchịchị ya jiri gbapee atụmatụ ịk

E meela Ụbọchị Anyarị n'Anambra, kpọọ gọọmenti oku nkwàdó

Image
  Izunna Okafor Dere Akuko a AKPỌKUOLA gọọmenti n'ogoogo dị icheiche ka ha nyere ndị ànyàrị (albino) aka n'ihe dị icheiche ha na-agabiga, ya na iji hụ na mbọ dị icheiche ha na-agba iji gbochie ọrịa kansa ime ha mị̀tàrà mkpụrụ a tụrụ anya.   Onyeisi òtù ahụ jikọtara ndị ànyàrị n'ime steeti Anambra, bụ Vivian Ezeonwumelu bụ ya kpọrọ oku a na n'okwu ya n'ọgbakọ e jiri merùbe Ụbọchị Ndị Anyarị na Mba Ụwa, nke afọ 2023, bụkwa nke weere ọnọdụ n'ogige 'Dora Akunyili Women Development Centre' dị n'Awka, bụ isi obodo steeti Anambra.   Na nkụzi ya na mmemme ahụ, nke Oriakụ Ezeonwumelu nyèrè nkọwa banyere ihe ndị ànyàrị acha oke ọcha nàkwà ihe kpatara ọnọdụ ahụ ha jiri dị etu ọ dị, na-enwe mmetụta anwụ na ụfọdụ ọrịa ndị ọzọ dị icheiche. Ọ gbarụrụ ihu banyere etu ụfọdụ gọọmenti n'ebe dị icheiche si eleghàrá ndị anyarị anya, etu e si emeso ha, na ihe dị icheiche ha na-agabiga; ma kpọọ òkù ka e weputesie amụma iwu ga-enye aka ibelata nke ahụ ma kwàlite ọdịmma

Oziọma Ọdịnanị: Ọrụ ogirisi na-arụ

Image
  Dike Ugbaja dere akuko a OGIRISI bụ osisi mmadụ niile ma-ama na ana Igbo.   Ndị Igbo hụrụ ya dịka osisi mmụọ, osisi ndụ na osisi ọmụ̀mụ̀. Ogirisi na-asọ omume ruru unyi, na àgwà na emerụ ana.   Ọọ ya kpatara onye Igbo ọbụna omenala doro anya, ma na anyị ji akwụkwọ ogirisi ajụchapụ ọrakwụ na ụchụ. Ụchụ na ọrakwụ bụ ihe ọbụna na egbochi ọganiru mmadụ.   Anyị jikwa Akwụkwọ Ogirisi akpọku mmụọ diche-iche dika Chi, Onye Uwa, Ndị mbụ na Ndị Egede.   N'eziokwu, ebe ọbụna dị nsọ, ị ga ahụriri Osisi Ogirisi.   Mana sọọsọ mmadụ ole na ole ma na Osisi Ogirisi bụ Ọgwọ́-nnù-ọrịa, maka na ọrụ ọ na arụ na ahụ mmadụ ka nkụ.   A chọba osisi ogirisi, a chọba oke ana, maka na ọọ ogirisi ka Igbo ji akpá okè ana karịa osisi niile.   Na-agbanyeghi na anyị ji ogirisi arụ ọrụ mmụọ diche-iche, ọtụtụ mmadụ amaghị na ya bụ Osisi bụkwa oke ọgwụ dị irè.   Ogirisi na-achụ nje dị na ọbara ụkwụ-eru-ana.   Ọzọ, i bụrụ nwanyi na-achọ nwa, biko chọba akwụkwọ ogirisi. Ị kpata akwụkwọ ogirisi, ị fọ

Mbonu, Ezekwesili na ndị ọzọ akatọọla etu e si akụ́tùsi ụlọ n'ahịa Alaba dị na Lagos

Image
  Chinwendu Uzoatu dere akuko a Ọ BỤGHỊZỊ akụkọ ọhụrụ ugbua na gọọmenti Steeti Lagos amalitela ikuri ụfọdụ ụlọ na mpaghara ahịa 'Alaba International Market' dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ojo nke steeti ahụ.   Ịkụtùsi ụlọ ahịa ahụ bụ nke a malitere ụbọchị ụka, ma bụrụkwa nke a na-eme n'agbànyèghị nkatọ̀ ọtụtụ ndị mmadụ na-akato atụmatụ ikutu ụlọ ndị ahụ, ma na-ekwu na nke ahụ na-egosi mmegbu a na-emegbu ndị si mpaghara Ndịda-ọwụwa Anyanwụ (ndị Igbo) bi ma na-azụ ahịa na Lagos.   Gọọmenti Steeti Lagos adịlarị na mbụ maa ọkwa n'isi ngwụcha izuụka gara aga banyere mkpebi ya ịkụtùsi ụlọ ndị ahụ, bụ ndị o kwuru na ha emeela ochie ma na-achọkwa ịda ada, nke mezịrị e jiri kpebie ịkụtùsi ha, iji gbanahị ajọ ọnọdụ mberede nwere ike ịdapụta ma a hapụ ụlọ ndị ahụ ka ha jiri aka ha daa.   Gọọmentị Lagos kwukwara na ọ bụghị ahịa 'Alaba International Market' kpọmkwem ka a na-akutu, kama na ọ bụ ụfọdụ ụlọ dị n'okirikiri ahịa ahụ bụ ndị esizighi ike, nke nwekwara ike ịda

N'Awka, ndị ACORA emeela Ụka Nna 2023, nye ụfọdụ onyinye nkwanyeùgwù

Image
  Izunna Okafor dere akuko a A KPỌKUOLA ma dụọ ndị nna ọdụ ka ha na-azụlite ụmụ ha n'ụzọ Chineke, dịka ndịisi ọzụzụ atụrụ ezinụlọ ha dị icheiche, ma na-atụkwasịkwa obi na Chineke oge niile n'agbànyèghị ọnọdụ ọbụla ha hụtara onwe ha n'ime ya.   Maazị John Ifejika bụ ya kpọrọ oku a n'okwuchukwu ya n'ụlọụka 'Anglican Church of Redemption, Awka' (ACORA), dị na steeti Anambra, dịka ndị nna ụlọụka ahụ sònyèèrè ndị otu ha na mba ụwa wee merùbe mmemme ụbọchị Ụka Nna nke afọ 2023 n'ụzọ pụrụ iche.   Maazị Ifejika, onye kọrọ akụkọ banyere etu nwaanyị a maara dịka... siri wee malite Ụbọchị Ndị Nna n'afọ 1910, kèlèrè ndị nna maka óké ụbọchị ahụ pụrụ iche, ma gwa ha ka ha gbalịsịa ike ịhụ na ha ji otu obi, otu mmụọ, na otu okwukwe eme ihe, ma nwekwa otu Chi, n'ihi na nke ahụ ga-enye aka ịkwalite idinotu ma mekwa ka ihe gaara ha nke ọma, ma n'ezinụlọ ha, ma n'ebe ndị ọzọ ha hụtara onwe ha.   Ọ gara n'ihu gwa ndị nna ka ha ñòmie Joseph nke akwụ

A tụọla odozi ụgbọala nga maka izu ohi tụrọụza

Image
  Chinwendu Uzoatu dere akuko a OTU ụlọikpe, Area Court dị na Jos, steeti Plateau atụọla otu onye odozi ụgbọala (mechanic) Gabriel Sunday nga ọnwa isii maka ịkụwa ọdụ ahịa (shop) ma zuru tụrọụza (trousers) na ihe ndị ọzọ dị n'ime ya.   Onye okwu dị n'aka, Ọkaikpe Shawomi Bokkos bụ onye tụrụ Sunday nga ka o kwuputachara na ya kpara arụ ahụ n'ezie mechara nye ya ohere ịkwụ ọnụ ego puku naịra iri (10,000).   Ọkaikpe ahụ gakwara n'ihu nye onye ahụ a mara ikpe iwu ka ọ kwụọ onye mere mkpesa puku naịra iri ise na anọ (54,000), iji tie ya aka n'obi. Ozi sitere News Agency of Nigeria kọwara na Ọkaikpe ahụ kwuru na nke ahụ bụ iji dọọ ndị ọzọ ga-achọ ịkpa ụdị arụ ahụ aka na ntị. Na mbụ, Ọkaiwu na-ekpere onye wetere ikpe ọnụ ya, Ibrahim Gokwat gwara ụlọikpe   na e wetere mkpesa ahụ ka ọnwa Mee dị n'abalị iri na isii n'ogige uweojii. Ọ bụ Charity Dalong   wetere ya.   Gokwat kwuru na Sunday na onye otu ya, nke nọ n'ọsọ ugbu a kụwara ọdụ ahịa ahụ ma zuru tụrọụz

Aka akparala ndị uweojii abụọ na anapụ ndị njem ego n'ike

Image
  Chinwendu Uzoatu dere akuko a NDỊ uweojii, State Criminal Investigation and Intelligence Department (SCIID),   nke steeti Rivers anwụchikọọla ma kpọchie ndị ọrụ ha mmadụ abụọ maka ịnapụ ndị njem ego n'ike.   E mere nnwụchikọ ahụ ka ọ gara abalị atọ aka na-achị steeti ahụ, Gọvanọ Siminalayi Fubara gbarụrụ ihu banyere ịnapụ ego n'ike na arụ ndị ọzọ ndị uweojii na-akpa n'ụfọdụ mpaghara dị iche iche na steeti ahụ.   Gọvanọ katọrọ otu ụfọdụ ndị uweojii siri napụ ndị ntorobịa Rivers ego n'ike, oge Kọmishọna uweojii na steeti ahụ, CP Emeka Nwonyi kpọtụụrụ ya n'obi gọọmenti. Ya mere, Gọvanọ kpọkuru ya ka o lebaa ọnọdụ ọjọọ ahụ anya, iji hụ na ọ bịara na njedebe.   Banyere ndị ahụ a nwụchikọrọ n'ihi ịnapụ ndị njem ego n'ike, ọ bụ site na mgbasaozi ọ gbara ọhụrụ ọnyanwudude 'twitter' nke otu onye o metụtara kụpụrụ ka e si chọpụta ya. Ya bụ nwoke e nyere aha ya dịka Napaul tinyere (tag) okwuputa okwu ndị uweojii ahụ, CSP Princre Adejobe Olumuyiwa na ndị

E jidela ndị na-amanye obere ụmụaka ịgba akwụna n'Anambra

Image
  Izunna Okafor dere akuko a AKA ndị uweojii akparala ụmụnwaanyị nwe ụlọ oriri na ọṅụṅụ 'Happiness Guest Inn' dị n'Amawbia, n'okpuruọchịchị ime obodo Awka South nke steeti Anambra, maka etu ha si amanye obere ụmụaka nwaanyị na ụfọdụ ụmụagbọghọbịa ndị ọzọ iji ahụ ha akpara ya ego (ịgba akwụna) n'ogige ebe ahụ.   Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Tochukwu bụ ya kwupụ̀tàrà nke a n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ na nsonso a n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.   Dịka o siri kọwaa, ụfọdụ n'ime ụmụaka ahụ nwaanyị ahụ manyere ịgba akwụna n'ogige ya bụ ndị dị naanị afọ iri na ise, ma bụrụkwa ndị etozubeghị òkè ime ihe dị etu ahụ. O mere ka a mara na a zọpụtala ụmụagbọghọbịa niile ahụ oge ha wakporo ebe ogige ụlọ oriri na ọṅụṅụ ahụ.   DSP Ikenga kwuru na ọ bụ ndị uweojii steeti ahụ na ụlọọrụ na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ọdịmma ọhaneze na steeti Anambra bagidere na ya bụ ọrụ ịnapụ̀tà ndị ahụ, ma kọwakwa na ha m

Ihe mere e ji napụ ụmụnwaanyị ọchịchị

Image
  Chinwendu Uzoatu dere akuko a N'OGE gboo, mgbe elu bụ ala ọsa, mgbe ezi dị n'ukwu ụkwa, ọ bụ ụmụnwaanyị ka ọchịchị dị n'aka.Ụmụnwoke nọ n'okpuru ha, na-agbara ha odibo.   N'oge ahụ,ihe niile obodo nwere bụaha umunwaanyị ka ha na-aza,o buladi ụmụaka a mụrụ n'ezinaụlọ bụ aha nne ha ka ha na-aza. Ụmụnwaanyị maara ka e si achọpụta ihe dị nwoke n'uche, nke a mere ka ha nwee ike ọchịchị dị egwu oge ahụ.   Ya mere, ka ụmụnwaanyị nọ n'ọchịchị kpara ike na-aga, iwe bidoro webe ụmụnwoke nke mere ka ha nọọ nzukọ. Na nzukọ ahụ, ha kpara aro ụzọ ha ga-esi napụta ụmụnwaanyị ọchịchị n'ihi na ka ihe si aga, ọ dịzị ka ụmụnwaanyị o kere ha agbụ. Ụmụnwoke makwa na ọ ga-esiri ha oke ike ịnapụta ụmụnwaanyị ike ọchịchị n'ihi na o doro ha anya na ụmụnwaanyị agaghị enye ha ohere. Ma otu o sila dị, ndị Igbo kwuru na nsị anaghị anọ n'afọ esi isi. Na nzukọ ahụ, otu nwoke tụrụ atụmatụ bụ ịgba. O kwuru na ebe ọ bụ na ụmụnwaanyị na-enwe nsogbu dịka ike ọgwụgwọ ma

Tinubu achụsịala ndịisi ọrụ nchekwa niile, kpọlite ndị ọhụrụ

Image
 Izunna Okafor dere akuko a Ọ NA-ADỊ mma a sụgide ụtara, e hogharịa ọdụ.   Ọ bụ n'ịgbaso nke a ka Onyeisiala Nigeria, Maazi Bola Ahmed Tinubu jiri chụsịa ndị niile ọchịchị pụrụ apụ kpọlitere ịnọ n'isi na ngalaba ọrụ nchekwa dị icheiche n'ala Nigeria, nke gụnyere ndịisi ndị agha ala, ndị agha elu, ndị agha mmiri, na ndị uweojii.   Nke a bụ nke e kwupụ̀tàrà site n'ọnụ onye na-ahụ maka mgbasaozi, bụ Willie Bassey, n'aha Odeakwụkwọ Gọọmenti Etiti ala Nigeria, n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ n'Abuja ụbọchi Mọnde.   Ka ọ chụtùchara ndị ahụ n'ọkwa, Onyeisiala, Tinubu, kpọlitekwara ndị ọhụrụ ga-anọ̀chi anya ha n'ọkwa ahụ ozigbo, ma gwa ha ka ha malite ọrụ n'egbughị oge.   Ndị ahụ ọ chụtùsiri n'ọkwa na ndị ọhụrụ ahụ ọ kpọlitere gụnyere: Maj. Gen. Christopher G. Musa nọchiri anya Lucky Irabor, onye jibu ọkwa 'Chief of Defence Staff'; Maj. Gen. Taoreed. A Lagbaja nọchiri anya Faruk Yahaya, onye jibu ọkwa 'Chief of Army Staff'; Rear

Lamido etoola Dayọsis Niger, gwa ndị ụka ka ha na-edebe okwu Chineke

Image
  Izunna Okafor dere akuko a A KPỌKUOLA ma dụọ ndị mmadụ, ọkachasị ndị ụka ka ha bụrụ ndị na-edebe okwu Chineke na-emekwa ya eme oge niile ka ihe wee gaara nke ọma.   Òkù a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ onye ji ọkwa Diin (Dean) nke ụka Angịlịkan n'ala Nigeria, bụ 'Most Rev.' Ali Buba Lamido n'okwu ya na mmemme ọgbakọ sinọọdụ Dayọsiisi Niger nke afọ 2023.   Ya bụ sinọọdụ bụ nke abụọ n'ime àgbà sinọọdụ nke iri atọ na abụọ Dayọsis ahụ na-eme, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'ụlọụka St. John's Anglican Church, Fegge, dị n'Onitsha, n'okpuruọchịchị ime obodo Onitsha South nke steeti Anambra.   N'okwu ya n'ebe ahụ, Ashbisọp Lamido kọwara na ndụ ezi onye òtù Kraịst bụ ngosipụta ụdịdị Chineke nà ịgbaso usoro o si eme ihe, ọbụna dịka ọ kpọkuru ndị ụka ka ha bụrụ ndị òtù Kraịst n'eziokwu ma na-egosipụta ya n'okwu ọnụ ha na omume ha oge niile.   Dịka ọ na-akatọ etu ụfọdụ ndị ụka si eme omume anaghị egosi na ha bụ ndị òtù Christ, ya bụ nnukwu

Ụzọ dị iche iche ị ga-esi chọputa onye nwere isimgbaka

Image
  Chinwendu Uzoatu dere akụkọ ndị a OKE ọnọdụ mgbanwe dịka iwe iwe ọkụ, ibe akwa kwamgbe kwamgbe, ịlụ ọgụ na iche echiche banyere ịtụ ụdọ. Mmadu ibi ndụ n' ịta onwe ya ụta na amamikpe. Oke itu egwu na mgbakasị ahụ banyere ihe ọbụla (worries). Echiche banyere mmegide na mmegbu. Mmadụ iwepu onwe ya iche n'ebe ndị ozo nọ. Enweghị agụụ iri ihe oriri na ileru onwe onye anya. Arahụghi ụra nke ọma E kwenyeghi n'ihe onye ọzọ na-ekwu. Enweghịzị nchikọta maobu itinye uche n'ihe na-eme gburugburu ya. Oke ịnọ nwayọọ, egheghi mmadụ ọnụ.    

Nsogbu ụwa, obi nkoropụ na ọrịa isimgbaka

Image
  Chinwendu Uzoatu dere akụkọ ndị a NKATA ekwupula ike. Ihe adịghịkwa ka ọ dị na mbụ. Onye elu na-ebe maka ọnọdụ ala anyị nke debere ihu ka ntọọ, onye ala na-ebe.   Ihe isi ike juru ụwa nke na onweghị onye hụrụ tụtụrụ rachaa. Ndị na-azụ ahịa na-akọwa na ha anaghị enwezi uru n'ahịa, na ha rechaa ahịa ha achọwa isi nne ego ha. Ndị ọrụoyibo n'akụkụ nke ha na-ekwu na ego a na-akwụ ha anaghị ezuziri ha igbo mkpa dịịrị ha. Ndị ọrụaka n'onwe ha wee na-ekwu na ha anaghị ahụzị ndị na-agba ha aka ahịa. Ihe ndị a niile bụ ihe njọ ụbọchị na-akpata.   N'ihi ọnọdụ ọjọọ a, ọtụtụ ndị mmadụ anaghị enwezi obi aǹụrị, nke mere na ihe na-esiwanyere ha ike karịa, maka na ndị be anyị kwuru okwu si, onye wee iwe, ụwa aka ya njọ. Ụfọdụ ka ọnọdụ a tinyere na jebe ejebe adị mma, lawa alawa adị mma. Ụfọdụ agbaala mbọ n'elu gbaa n'ala, ma ejula olee nne gị? kokororo m!   Ka ọ dị ugbu a, imirikiti ndị mmadụ amalitela ịkpa agwa ka ndị na-arịa ọrịa isimgbaka. Agwa ndị a gụnyere oke iwe

Aka akparala dibịa chọrọ itigbu nwa ya

Image
 Chinwendu Uzoatu dere akuko a ỌKỤKỌ ntị ike na-anụ ihe n'ite ofe.   Ka ọ dị taa, aka ndị uweojii na steeti Anambra akparala otu nwoke maka imegide nwatakịrị ya na ya bi n'ụlọ, bụkwa onye ọ na-emegbukwa n'ụdị dị icheiche.   Nwoke ahụ, bụ Maazị Sunday Ezeh, onye e jidere n'obodo ya bụ Nise, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Awka South nke steeti ahụ, na nsonso a, mgbe e nwetechara ozi banyere ihe ọjọọ dị icheiche o mere nwata ahụ, bụkwa nwa ya nwaanyị, ọkachasị site n'iti ya ihe ka a ga-asị na ọ bụghị mmadụ Chineke kere eke.   Dịka akụkọ siri kọọ, Maazị Ezeh, onye bụkwa dibịa mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ, ka e kwuru na o jiri achara, ụtarị na ihe ndị ọzọ dị icheiche wee merụsịchaa nwatakịrị ya na ha bi ahụ, ma bokwa ya ụdị apa dị icheiche n'ụdị na ọ na-apịa ya ihe ma na-enye ya ntaramahụhụ maka ihe o mere.   Nwatakịrị nwaanyị ahụ o mere ihe ahụ, bụ Nwaada Ezeh bụ onye gbara naanị afọ iri na asaa, ma bụrụkwa onye nọ ugbua anara ọgwụgwọ n'otu ụlọọgwụ dị n

O buru ụzọ jide m n'akwa tupu m were mma sụọ ya – Kọndọkịta gburu onye ashawo ka ha nwechara mmekọ

Image
    Chinwendu Uzoatu dere akụkọ ndị a ONYE uweojii gbara aka ebe (police prosecution witness) Inspektọ Jola Oso gwara ụlọikpe Lagos State High Court dị na Tafawa Balewa Square otu ya siri nyochaa ogbugbu e gburu otu onye ji ahụ ya akpa ego (akwụnakwụna) aha ya bụ Elochukwu Solomon, gbara afọ iri abụọ na asatọ. Onye nke otu onye na-eso ụgbọala (bus conductor), Babatunde Oluwadamilare dulara mmụọ.   Onye uweojii ahụ, nke onye ọkaiwe steeti ahụ, Olayemi Shofolu dubatara kọwara na Oluwadamilare depụtara n'ozi ya sị na ya na Solomon (nwaanyị o dulara mmụọ) kwekọrịtara na ọ ga-akwụ ya puku abụọ (N2,000), ma ka ha nwechara mmekọ nwoke na nwaanyị na Solomon jụrụ ị nara ya ole ego ha kwuru; kama ọ gwara ya na ọ bụzị puku asatọ (N8,000) ka ọ ga-akwụ.   Dịka ọ gara n'ihu kwuo, na nwoke ahụ sị na ọ bụ onye akwụnakwụna ahụ lara mmụọ bụ ụzọ jide ya n'akwa, tupu ya wee hụ mma nri (kitchen knife), ozugbo were ya sụọ ya.   Oge a jụrụ ya ihe bụ mkpebi ya n'okwu ahụ, onyeuweojii ahụ

Nwata nwoke afọ 16 emetọọla nwata nwaanyị afọ abụọ

Image
  Chinwendu Uzoatu dere akuko a NDỊ uweojii steeti Edo anwụchikọọla nwata nwoke gbara afọ iri na isii maka ịdakpo nwata nwaanyị gbara afọ abụọ.   Ka a na- akpụgharị nwata nwoke ahụ kpara arụ, okwuputa okwu ndị uweojii na steeti ahụ, Chidi Nwabuzor, onye kwuputara na a nwụchikọrọ nwoke ahụ n'ezie kwuru na ọ kpara arụ ahụ n'Egba dị n'okpuru ọchịchị Uhunwondu.   Ọ kọwara na ndị uweojii nwetere mkpesa na a kpara arụ ahụ wee zọpụ ije ozigbo, wee nwụchikọọ ya. Nwabuzor kwuru na nnyocha na-aga n'ihu ugbu a banyere okwu ahụ n'okpuru ndị ọ dị n'aka, (Gender Unit of the Criminal Investigation Department). O kwere nkwa na a ga- akpụpụ ya bụ nwa kpara arụ ụlọikpe, ozigbo e mechara nnyocha.   N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ mgbe a na-agba ya ajụjụ ọnụ, nwata nwoke ahụ kwuru na ya amaghị ihe banyere ya n'ime.   Ọ gwara ndị uweojii sị: "Nwata nwaanyị ahụ gbara afọ abụọ na- abịakwute nwanne m nwaanyị oge niile. Ọ bịara ụbọchị ahụ m sị ya laba na nwanne m nwaa