Onyeisi ụlọọrụ NAFDAC sị na Indomie dị na Naịjirịa dị mma maka oriri
ỤLỌỌRỤ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC) ekwuola na akụkọ na-efegharị n'ikuku na ha amachiela Indomie Instant Noodles abụghị eziokwu.
Ụlọọrụ NAFDAC kwuru nke a n'ụbọchị Mọnde si n'aka onyeisi ụlọọrụ ha bụ Mojisola Adeyeye, sị na o nweghị mgbe ha machịrị ya bụ ngwa ahịa a Indomie na Naịjirịa.
N'ọnụ Adeyeye, “NAFDAC amachịghị ya bụ ngwa ahịa Indomie Instant Noodles arụpụtara na Naịjirịa. NAFDAC edebanyela aha ọtụtụ ndị ụlọọrụ ndị ọzọ dịka Indomie noodles ndị hs binyere aka sị na ha dị mma maka oriri.
Ngwa ahịa noodles si mba Taiwan na Maleshịa ụlọọrụ Nafdac rụrụ aka maka mmachi enweghị ihe gbasara ha na ndị na-arụpụta ya na Naịjirịa.”
Okwu a dịịrị ndị na-egoro ahịa ezigbo mkpa maka na akụkọ ụgha dị icheiche gụnyere na ụlọọrụ Nafdac amachiela ya bụ ngwa ahịa a.
Akụkọ ndị a gbajuru ebe niile malitere kamgbe ya bụ ethylene oxide, na-ebute ọrịa kansa a hụrụ n'ime ihe e ji esi Indomie nke ọkụkọ na mba Taiwan, na Maleshịa n'aka ndị ọrụahụike mba ahụ.Dịka o kwuru n'okwu ya, onyeisi ọrụ ndị mgbasaosi na mmemme n'ụlọọrụ Dufil Prima Foods Plc, bụ Tope Ashiwaju si, “Anyị ga-achọ ka ndị niile na-egoro anyị ahịa na Naịjirịa na Indomie niile e riri na Naịjirịa bụ nke a rụgharịrị site n'usoro ziri ezi nke ISO.
Ebumnuche anyị bụ ịhụ na anyịamegideghị iwu nrụpụta ngwa ahịa anyị dị n'ime akpa Indomie niile anyị rụpụtara n'ụlọọrụ anyị nille na Naịjirịa soro usoro a ziri ezi.”
“Anyị na-esokwa usoro niile ụlọọrụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC) nakwa ụlọọrụ Standards Organization of Nigeria (SON) hibere n'atụmatụ nrụpụta anyị niile.”
Ọ sị "Anyị ji sọọsọ ngwa nri si n'ezigbo ndị ọrụubi makwa ndị ụlọọrụ anyị anyị na-etinye anya n'ihe ha na-eme kwagbe ịhụ na ha mere ihe niile ha kwesịrị”.
Indomie niile Instant Noodles e riri na Naịjrịa bụ nke Dufil Prima Foods Plc soro n'usoro niile ziri ezi n'usoro niile mbaụwa niile n'ụwatụmadị n'iwu ISO nakwa nke ụlọọrụ NAFDAC hibere.
Comments
Post a Comment