OCHA Brigade adọọla aka na ntị megide mmetọ gburugburu n’Anambra
Izunna Okafor dere akuko
ỤLỌỌRỤ 'Operation Clean and Healthy Anambra (OCHA Brigade)' ekwupụ̀tala mkpebi ya, njikere ya na nzọpụụkwụ ya igbochi na ịkwụsị kpamkpam, etu ụfọdụ ndị mmadụ si emetọ̀sị gburugburu steeti Anambra n'ụdị dị icheiche
Onyeisi ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Celestine Anere, bụ ya kwupụ̀tàrà nke a oge o duru ụfọdụ ndị òtù ọrụ ya wee kpagharịa n'ụfọdụ mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ, iji mara ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ, ya na iji chụọ ndị omekome ọsọ ụkwụ eru ala dịka ha sigoro mee n'ụfọdụ ebe dị icheiche.
Ebe dị icheiche ha gara gụnyere mpaghara Zik's Avenue, mpaghara Ahịa Ọchanja, mpaghara Minaj Obosi, na ebe ndị ọzọ.
Ndị ọrụ OCHA Brigade ahụ nọ̀kwara n'ebe ndị ahụ ha gagharrịrị ụbọchị ahụ wee nwụchikọọ́ ụfọdụ ndị ọna ụtụ iwu akwadòghị̀, bụ ndị na-ebugharị onwe ha n'ụdị na ha bụ ndị ọrụ gọọmenti; wee jiri aha gọọmenti na-anapụ̀sị ụmụ mmadụ ego ha tara ahụhụ kpata.
N'okwu ya n'ebe ahụ, Onyeisi OCHA Brigade, bụ Maazị Anere kọ̀wàrà na etu ndị mmadụ si arụkwasa ụlọ n'ebe ọwammiri siri gaa so n'ihe kachasị emetọ̀ ọnọdụ gburugburu ma na-emekwa ka ebe ahụ na-apịtọ apịtọ ma na-erukwa unyi, ọkachasị n'oge udummiri, n'ihi na oge ọbụla mmiri zoro, idei mmiri agaghị ahụ ebe ọ ga-edi wee gafee maọbụ gbadaa n'Ohimiri Naịja, nke na-emezị ya ka ọ na-adọrọ adọrọ maọbụ na-ehuje n'ebe ekwesighị ekwesi, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ na-ebute oke ijummiri na mpaghara ebe ahụ na ajọ ọnọdụ gburugburu ndị ọzọ na steeti ahụ.
O mèrè ka a mara na ụlọọrụ ahụ agaghị ada mbà n'ịrụ ọrụ ya, ma kwupụtazie ezi njikere ụlọọrụ ahụ dị ịkwalite ọnọdụ adịmọcha gburugburu steeti ahụ n'usoro kacha mma. Ọ gwakwazịrị ndị bi na mpaghara ebe ahụ ka ha nye aka mee ka ọrụ ahụ dịrị gọọmenti mfe, ọkachasị site n'ime ihe a gwara ha mee, maka na nke ahụ bụkwa maka ọdịmma ha, obodo ahụ na steeti Anambra n'izugbe.
Ọ katọrọ otu ndị mmadụ siri were atịtị na ahịhịa sụchisie ọwa mmiri dị iche iche na mpaghara ahụ, bụzị nke na-eme ka mmiri na-emebìsi okporo ụzọ; ma kpọkukwazie ndị bi ebe ahụ ka ha na-edebe gburugburu ha ọcha oge niile, ma kwụsịzie ichè na ọ bụ ọrụ dịịrị naanị gọọmenti.
Ọ dọkwazịrị ha aka na ntị ka onye ọbụla kwụsị ịwunye ahịhịa n'ọwà mmiri, ma na-esonyesikwa ike n'amụmà ọrụ mkpocha na nzacha ahụ a na-eme na steeti ahụ ugbua, n'ihi na onye ọbụla metọ̀rọ̀ gburugburu ka a ga-ejide, ma jiri usoro iwu gwọọ ya ji mmanụ.
Comments
Post a Comment