Ndị Odozi Obodo emeela ụka nne n'Awka
Izunna Okafor dere akuko a
A KPỌKUOLA ma dụọ ụmụnwaanyị ọdụ ka ha nọgidesie ike n'ezi omume, dị ike ma na-ekpesikwa ekpere ike oge niile iji guzogide ihe ọbụla chọrọ itisà udo na ọganiru nke ezinụlọ ha.
Onyeisi nchụaja nke ụlọụka 'Christ Holy Church International' dị n'Awka (nke e ji Odozi Obodo wee mara) bụ Ụkọchukwu David Achukwu nyere ndụmọdụ a n'okwuchukwu ya na mmemme ụka nne nke afọ 2023 nke ụka ahụ mere.
N'okwuchukwu ya na mmemme ahụ, Venerebụl Achukwu dụrụ ha ọdụ ka ha dị ike, ma n'ekpere, ma n'ịrụ ọrụ dịịrị ha dịka nne n'ezinụlọ, maka na ọ bụ ihe doro anya na ihe mkpọbiụkwụ na ihe iche aka mgba nwere ike ịdapụta na mgbe na mgbe.
Ọ dụkwazịrị ha ọdụ ka ha tụkwàsị Ibi na Chineke ma na-ekwesikwara Chineke ntụkwasịobi, n'agbanyèghị ihe dị icheiche ha nwere ike izute n'ime alụmdinanwunye ha.
Dịka ọ na-akatọ̀ akparamagwa ụfọdụ ụmụnwoke na-eti nwunye ha ihe maọbụ na-emekpa ha ahụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ; ọ gwakwara ụmụnwaanyị ka ha yiri ezi akparamagwa dịka uwe ma bụrụ ndị ezigbo nne.
Mmemme ụka nne ahụ bụkwa nke a nọrọ na ya wee kpee usoro ekpere di icheiche, mee ihe ngosi obere ejije, waa achịcha bekee, ma gbakwa ọnya ego maka nkwàdo òtù ụmụnwaanyị.
N'okwu ya n'ebe ahụ, onyeisi ụmụnwaanyị n'ụlọụka ahụ, bụ Oriakụ Josephine Achukwu kèlèrè ndị nyere aka maọbụ tụnye ụtụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ iji mee ka ya bụ mmemme dàá ụdà. O kwupụtazịkwara olileanya o nwere na nke afọ na-abịa ga-amakarị nke afọ ma kakwa ya dàá ụda nke ukwuu.
Mmemme ụka nne ahụ bụkwa nke a nọrọ na ya wee kpee usoro ekpere dn icheiche, mee ihe ngosi obere ejije, waa achịcha bekee, ma chụkwa nta ego maka nkwàdo òtù ụmụnwaanyị na ọrụ ụlọụka ahụ.
Comments
Post a Comment